Ihe 8 onyeisala Buhari kwuru maka ụmụaka taa

Buhari na ụmụaka Image copyright Muhammadu Buhari /Facebook
Nkenke aha onyonyo Nicole Benson tụkọtara onyeisiala ego ruru puku naịra ise na narị asaa na kọbọ iri asatọ na ise

Ụbọchị 27 ọnwa Mee afọ niile bụ ụbọchị pụrụiche a na-eme mmemme ncheta ụmụaka n'ụwa niile.

Onyeisiala Muhammadu Buhari sonyere ụwa niile ma tinye olu ya n'ọdị mma ụmụaka site n'akwụkwọ ozi o dere iji kelee ụmụaka.

N'akwụkwọ ozi ya, Onyesiala kpatụrụ ọtụtụ ihe aka etu o si gbasara ụmụaka na Naịjirịa nakwa ihe gọọmenti ya na-eme iji hụ na ụmụaka Naịjirịa nwere nchekwa tọọrọ atọ.

O kwuru ihe gọọmenti ya megoro na nke ha ka ga-eme ichekwa ụmụaka na Naịjirịa.

Ihe 8 Onyeisiala kwuru:

  1. Ego nwatantakịrị Nicole Benson nyere onyesiala n'afọ 2015 ka ọ tinye n'ego o ji chụọ nta vootu ka dị ya n'obi ebe o chetara ya na Aliyu Gebbi bụ onye deere ya akwụkwọ ka ọ gbakee n'oge ọ nọ na-akwa ọrịa nakwa Maya Jammal bụ onye mere ihe onyonyo gbawara ịntanetị n'afọ 2017. Onyeisiala kelere ha ma kwuo na ha na-akpali mmụọ ya
  2. Ụmụaka ruru nde mmadụ 8.4 n'ime steeti 24 nọ n'ụlọakwụkwọ praịmarị nke gọọmenti, na-eri nri na-efu n'ụlọakwụkwọ ha site n'atụmatụ nke o kporo "Home Grown School Feeding Project" na Bekee Atụmatụ a na-aga n'ihu etu ọ dị n'ụlọakwụkwọ ruru 45,000 n'obodo niile
  3. Gọọmenti ya bidoro atụmatụ ikwalite ụmụaka n'ọnwa Mee afọ 2015
  4. N'afọ 2016, ha malitekwara atụmatụ ịkwụsị mmegbu ụmụaka
  5. N'otu afọ ahụ, ha bidokwara atụmatụ ịkwụsị ụmụaka ịlụ di nke kachasị eme na mpaghara ugwu Naịjirịa
  6. A gụnyere Naịjirịa dịka mba bu ụzọ n'ọgụ a na-alụ megide mmegbu ụmụaka mana o kwughi ndị nyere Naịjirịa ọkwa ahụ
  7. O nyere ndị isi ụlọakwụkwọ sekọndịrị gọọmenti etiti, ezinaụlọ na ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha gbaa mbọ hụụ na ụmụakwụkwọ ha na ụmụaka niile nwere ezi nchekwa
  8. Ọzụzụ nwa nwaanyị na Naịjirịa maka iji belata ọnwụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na ụmụaka dị ime.

Ihe ndị Buhari na-ekwughi

Image copyright Muhammadu Buhari/Facebook

Mana o nwekwara ihe ndị ọ na-ekwutaghị maka ya n'akwụkwọ ozi ahụ.

O kwuteghi okwu gbasara ụmụaka ndị Chibok ndị fọrọ n'aka ndị Boko Haram ndị a na-agbapụtabeghi, bụ ndị nọrọla afọ ise n'aka ndị Boko Haram.

N'aka nke ọzọ, o kwughikwa maka nwantakịrị nwaanyị bụ Leah Sharibu bụ otu onye ndị Boko Haram jụrụ na ha agahị ahapụ oge ha hapụrụ ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ọzọ ha tọọrọ n'obodo Dapchi dị na Yobe steeti.

Leah Sharibu ka nọkwa n'aka ndị Boko Haram maka na ọ bụ onye na-ekpe okpukpe ụka Kraịst. Oge a hapụrụ ụmụaka a tọọrọ ya na ha, ha kwuru na ọ dị ndụ mana amaghị ka ọ ka dịkwa ndụ.

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa agbapụtabeghi ya, ma onyeisiala Buhari ekwutaghịkwa maka ya n'ozi o zipuru maka mmemme ncheta ụmụaka taa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara