Ugwuanyi chọrọ ka Enugwu bụrụ obodo kacha dị ọcha

Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ụgwuanyị Image copyright Enugu state official website
Nkenke aha onyonyo Ugwuanyi bụ onye pati PDP, nke nọbụ n'ọchịchị na Naịjirịa

Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi ahọpụtala ntorọbịa 1000 ọrụ ha ga-abụ ikpocha na ịzacha steeti ha.

Imezu nkwa o kwere ime ka steeti ya dị ọcha nakwa bụrụ ebe nchekwa bụ ọkachamkpa nke ọ kpọrọ 'Enugu Clean Team Project', Ugwuanyi họpụtara ndị ntorobịa ole na ole a nke mkpocha na nzacha ga-abụ ọrụ ha gawa n'ihu.

Ugwuanyi kwuru na ebumnuche ya bụ na mkpocha na nzacha a ga-eme ka ọrịa ndị dị icheiche wetuo aka n'ịrịa ndị mmadụ.

O kwukwara na ọ ga-eme ka Enugwu maa mma n'anya. O kwukwara na ọ bụ ụzọ e si ekewapụtara ndị ntorobịa ọrụ.

Ugwuanyi kwuru "Ọ bụ olileanya anyị na ọrụ a ga-enyere anyị aka imezu ọchịchọ anyị bụ ka Enugwu bụrụ steeti kacha dị ọcha na mba anyị.

N'ihi ya, eweela otu puku (1000) ndị ntorobịa Enugu steeti n'ọrụ isonye n'ọrụ ngo a. Ọhụụ a bụ ihe butere nkewapụta ọrụ ndị na-enye ndị ntorobịa ọzụzụ nakwa ndị na-enye ha ọrụaka nke e bidorola na steeti a."

Ugwuanyi kwere nkwa na gọọmentị ya ga na-enye otu ahụ ngwaọrụ ọbụla bụ ihe ha chọrọ iji mee ka ọrụ ha nwee ike ịga ọfụma.

Ọ kpọkukwara ndị bi n'Enugwu, ụlọọrụ, nakwa ndị na-abụghị ndị ọrụ gọọmentị, sị na ọ bụghị naanị gọọmentị ka ọ dị n'aka ịhụ na obodo dị ọcha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara