Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Moses apụọla n'otu ga-aga Russia
Akụkọ kachasị mkpa: Ndị IPOB na ndị uweoji na-ama aka n'Anambra steeti.

Ebe foto si, AFP
Nke abụ maka iwu ndị IPOB nyere sị ndị mmadụ ha nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa mee.
Ndị uweojii jisike na-ekwu na ha enweghi ịke ị nye ụdị iwu ahụ.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ebe foto si, AFP
Minister na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na Buhari mezuru nkwa niile o kwere ndị Naịijirịa.
Ọ sị na Buhari doziri ihe ndị gbasara nchekwa, akụ na ụba obodo na npụ karịcha.
Na mba Ofesi
Ebe foto si, AFP
Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị na Italy akpọla oku ka achụtuo onyeisiala ha bụ Sergio Mattarella n'ọkwa ọchịchị
Luigi Di Maio kwuru nke a mgbe onyeisiala ha jụrụ ị nabata aha Guiseppe Conte dịka minista ga-eso n'ọchịchị ya
Cheta na amabeghị onye meriri ntuliaka Italy mere kemgbe ọnwa Maachị.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Moses apụọla na otu 'Super Eagles' ga-aga asọmpị iko mba ụwa.
Moses Simon bụ onye egwu boolu 'Super eagles' agaghị aga Russia n'ihi na ọ merụrụ ahụ na akpata ụkwụ.
Nke a pụtara na ọ fọrọ mmadu iri abụọ na itoolu ga-agazi asọmpịi ahụ.
Gee akụkọ ndị mere taa n'ime otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile