World Menstrual Hygiene Day: Ụzọ ịse ụmụagbọghọ ga-esi debe onwe ha ọcha na nsọ

Akwa nso eji akwa ndị ochie arụpụta
Nkọwa foto,

Akwa nso e ji akwa ndị ochie arụpụta

'Menstrual Hygiene Day' bụ ụbọchị e wepụtara iche maka ikuziri ụmụagbọghọ etu ha ga-esi debe onwe ha ọcha mgbe ha nọ na nsọ.

Otu nwaanyị na-arụ n'ụlọọrụ enyemaka ebe a na-akuziri ụmụaka etu ha ga-esi debe onwe ha ọcha bụ Ijeamaka Nwizu, gwara BBC Igbo ụzọ ise nwaanyị ga-eji debe onwe ya ọcha.

1. 'Mụta ka e si arụ akwa eji anọ na nso'

Ọ bụrụ na i nweghị ego imefu n'akwa nsọ a na-etufu etufu a kpọrọ 'disposble pad' na bekee, ọ ga-adịrị gị mma ma ị mụta etu ị ga-esi kwaa nke a na-asụ asụ.

2. Gbaa mbọ gbanwe ya bụ akwa kwa elekere anọ

Nkọwa foto,

O kwesiri ka nwaanyị ọbụla na-agbanwe akwa nso ya kwa elekere anọ

Nke a bụ iji gbochie mmetọ ejiji gị ma gbochikwa isi na ihe unyi ndị ọzọ nwereike ibute ọrịa.

3. Sachaa ahụ gị ọfụma

Nkọwa foto,

O kwesiri ka ị kwọ aka ọfụma ma ị metụ cha akwa nsọ gị aka

Ịsa ahụ gị ka o si kwesi ịdị bụkwa ụzọ ọzọ ị ga-esi gbochie ọrịa ndị si n'ụzọ unyi abịa n'ime ahụ mmadu.

4. Mara etu ị ga-esi tufu akwa nsọ gị ma ị mechaa

Nkọwa foto,

Ọ gaghị abanyere gị uru ma ọ bụrụ na ijiri akwa nsọ gị mee ka mbara gị ruo inyi

Ọ dị mma ibu mbara na gburugburu gị n'ụche ma ị na-achọ ebe ị ga-etufu akwa nsọ gị.

Ị tufuo ya n'ụzọ ezighị ezi nwereike ibute ọrịa dị icheiche.

5. Jiri ọzọ ma ị na-apụ apụ

Nkọwa foto,

Ụmụakwụkwọ ji ụfọdụ akpa akwa nsọ dị n'ime ya

Nke a bụ maka ịdị njikere ma gbochikwa ihe mberede ime gị n'ụlọọrụ, n'ụlọakwụkwọ maọbụ ebe ọ bụla ị jere.

Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: