Naịjirịa na Kongo agbaala otu n'otu n'asọmpi enyi na enyi

Ndị Super Eagles Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị Eagles nwere olileanya na ha ga-eme ọfụma na Roshịa

Ka Naịjirịa na Kongo zutere onwe ha taa, olileanya ndị kwụ ha n'azụ bụ na mmeri ga-erute ndị nke ha aka.

Ndi ihe a kachasị metụta bụ ndị Naịjirịa makana ha na-ahụ asọmpi a ka ihe ndị Super Eagles ga-eji kwado iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ụbọchị ole na ole na-abịa.

Ka asọmpi ahụ bidoro, ọ dị ka ndị Super Eagles ga-enwere ụbọchị ka Troost-Ekong gbakara ọnụ goolu ndị Kongo na nkeji 14.

Mana, Kongo jiri penariti nye goolu nke ha n'elekere 78. Ngulubi tọghapụrụ ochegoolu Eagles bụ Uzoho were nye goolu ahụ.

Nke a mere ka ha gbaa onwe ha onye lawa onye lawa.