Goolu ndị pụrụiche n'asọmpi iko mbaụwa
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Rọshia 2018 fọrọ abalị 9: Goolu m agaghị echefu n'asọmpi iko mbaụwa

Ihe ndị mmadụ na-elegara anya n'asọmpi bọọlụ abụghị naanị goolu mana ọ bụ etu e si nyee ya bụ goolu.

Ụfọdụ goolu bụ ndị anaghị echefu echefu maka etu onye nyere ya si gbabaa bọọlụ ahụ na nko na-enye ọnụ.

BBC Igbo weghachiri ndị mmaọdụ azụ ka ha cheta goolu ndị pụrụiche n'asọmpi iko mbaụwa.

Ha chetara goolu ndị nyere ha ọnụ maa mepụtakwa ihu Naịjirịa, abọ ha kpụ n'ọnụ bụ goolu Rashidi Yekini na Sunday Oliseh n'afọ 1994.

Lee ka ụfọdụ n'ime ha si wee kọwapụta etu Oliseh na Yekini si nyee goolu ndị ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: