Dọọnụ ndị Ipob aka na ntị maka ịnọ n'ụlọ echi - Arewa

Ndị na-akwado Ipob Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị na-akwado Ipob chọrọ ịnọdụ n'ụlọ n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee maka 'ụbọchị ncheta Biafra'

Ndị otu Arewa Consultative Forum (ACF) chọrọ ka ndị gọvanọ steeti ndị dị n'ọwụwa-anyanwụ hụ na ndị otu Ipob emeghị 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' ha chọrọ ime echi bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee.

Ndị ACF kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ dọọ ndị Ipob aka na ntị maka na ihe ha chọrọ ime adịghị mma maka ndịnotu Naịjirịa.

Ha kwuru na ihe kpatara ha ji kwuo okwu a bụ maka na otu ngagharị iwe ndị otu Ipob mere n'afọ gara aga kwụsịrị na ndị omekome ịghasasị ihe niile ma merụọ ndị mmadụ ahụ.

ACF kwuru sị na ọ bụ "ya mere anyị achọghị ka ụdịrị ihe a mee ọzọ."

Ha kwuru sị "Anyị bụ ndị Arewa Consultive Forum nụrụ maka akwụkwọ ndepụta ndị otu Ipob bụ ndị gọọmentị etiti machiri ma kpọọ 'ndị oyi egwu' n'afọ gara aga, depụtara iji kwuo na Mee 30 nke afọ a bụ ụbọchị 'onye ọbụla nọrọ n'ụlọ' iji kwanyere steeti Biafra ugwu nakwa iji cheta ndị a na-asị na ndị ọchịehi gburu n'ime steeti iri abụọ na Naịjirịa."

"N'ịtụgharị uche banyere ihe merenụ, otu ACF na-akpọku ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ka ha gwa ndị obodo ha ka ha ghara ime ihe ndị ga-emebi ndịnotu anyị nakwa ihe ndị ga-emetụta akụnaụba na ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị na ọwụwa-anyanwụ nakwa Naịjirịa niile."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdi uweojii achụsịala ndị IPOB n'Ọka

Ndị ACF rịọkwara ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ ka ha gbaa mbọ hụ na ha chekwara ndụ ndị mmadụ bi na mpaghara Naịjirịa ahụ nakwa akụnaụba ha.

Ha kwuru okwu a site n'ọnụ onye odeakwụkwọ ha bụ Alhaji Muhammadu Ibrahim-Biu, ebe ha kelekwara ndị Naịjirịa maka ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a