Ndị IPOB adaghị iwu - Onye ọkaipe

Biafra na Naịjirịa Image copyright Ebere Ekeopara
Nkenke aha onyonyo 30 Mee 1967 bụ ụbọchị agha Biafra na Naịjirịa bidoro

Ndị otu na-achọ nwereonwe Biafra akpọrọ IPOB nyere iwu gwa ndị mmadụ n'ala Igbo ha nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị 30 ọnwa Mee iji cheta agha Biafra na ndị nwụrụ na ya.

Iwu a butere esemokwu ebe ndị ụlọọrụ nchekwa dị icheiche dịka ndị uweojii na ndị agha kwuru na nke a agahị eme.

Ha sị ndị mmadu gaa niru mee ihe ọ bụla ha chọrọ ị me n'agbanyeghị ihe ndị IPOB na-ekwu na ha dị njikere ị gbochi ọgbaghara ọ bụla nwereike ịme.

Ndị IPOB na-ekwukwa na ndị uweojii enweghị ikike ị gbochi ihe ha na-eme maka na ọ bụghị ihe ọjọọ ị cheta ndị nwụrụ na-agha.

Dịka ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Guardian si kwuo, ndị ụlọọrụ nchekwa NSCDC na ndị uweojii pụtara n'ọgbọ iji kasi ndị mmadụ obi ụnyaahụ n'Umahia.

Anthony Ogbizi bụ Kọmịshọna ndị uweojii na Abia steeti gwara ndị ntaakụkọ na emume a bụ iji gosi na ha dị njikere igbochi ọgbaghara ọbụla.

Otu onye ọkaikpe Precious Nwankwo gwara BBC n'ekwentị na ndị IPOB nwere ohere ime ihe ha chọrọ n'ime iwu Naịjirịa a kpọrọ 'Constitution' na bekee.

Nwankwo sị na IPOB horo ntutu taa sị na ihe ga-eme ma ndị mmadụ emeghị iwu ha, ọ bụ mgbe aha ka emume ha ga-ada iwu.

Gee ihe ọ kwuru n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMay 30: IPOB adaghị iwu

Mbọ niile BBC gbara ị nweta ndị agha maọbụ ndị uweojii maka ịnụta uche ha gbasara okwu a amịtaghị mkpụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara