Umahi: Onye ahịa ọbụla na-emepeghị ọdọ ahịa ya echi chefuo ya

Gọv David Umahi Image copyright David Umahị onn Facebook

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahị agwala ndị Ebonyi ka ha ghara iso n'oku onyenọrọbeya nke otu Ipob kpọrọ echị maka ncheta Biafra na steeti ahụ.

N'ozi ya na ncheta ụbọchị ọchịchị onyekwuoucheya nke mere n'Abakaliki taa, Umahi gwara ndị ahịa na onye ahịa ọbụla hapụrụ imepe ọdọ ahịa ya na Mee 30, chezọọ ya n'ihi na gọọmenti ga-eweghara ya.

" Onye ahịa ọbụla mechiri ọdọahịa ya ga-emechị ya ebighebi. Onye ọbụla dara iwu a ga-ata ahụhụ. A na m agwa ndị Ebonyị ka onye ọbụla gawara onwe ya mkpa ya na-enweghị nsogbu ọbụla."

Umahị kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyawụ kwuru ka amachie Ipob apụtaghị na mmegbu a na-emegbu ndị Igbo dị ha obi mma kama o kwuru n'ụzọ ndị Ipob si achụ ihe ha na-achụ megidere udo na ọganihu nke mpaghara ahụ.

Umahi onye bekuru gọọmenti etiti ka ha lebanye anya na mmegbu a na-emegbu ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ, dọrọ ndị Ipob aka na ntị ka ha ghara ime ngagharịiwe ọbụla na steeti ahụ echị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: