Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob akwụsiela ike maka ịnọ n'ụlọ taa

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Gọọmenti Ebonyi na Anambra sị na ndị ọrụ ga-aga

Image copyright Ebere Ekeopara
Nkenke aha onyonyo Ipob siri onwu na ndị mmadụ agaghị apụ taa

Dịka taa ga-eme ya afọ iri ise na otu ehibere Biafra, Ipob akwụsiela ike n'ịsị ndị o metụtara apụla ezi iji kwanye ugwu ndị tufuru ndụ ha na ya bụ agha nakwa gbanụgbanụ nwereonwe ndị ọzọ.

Otu dị iche iche na Naịjirịa, ọkachasị Arewa Consulatative forum akagbuole ya bụ agwa ma kpọọ oku ka otu Ipob sere aka enwe n'ofe na ya bụ ihe ha kpọrọ agwa ọjọọ.

Ngige awụọla mmịrị n'olileanya ndị ọrụ

Image copyright NLC/twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ tụrụanya na a ga-ebuli ụgwọọnwa ọpekata mpe n'ọnwa asatọ nke afọ a

Minista na-ahụ maka ọrụ na iwe ọrụ bụ Chris Ngige awụọla mmịrị n'olileanya ndị ọrụ oyibo.

Ngige kwuru na ya bụ olileanya na a ga-ebuli ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ oyibo agaghị abụ n'ọnwa asatọ nke n'afọ a dịka atụrụ anya.

Akụkọ mba ofesi;

Chị ewere ehihie jie n'India

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Amụma mmiri ka njọ n'ọwụwa-anyanwụ India ebe mmadụ iri abụọ nwụnyụrụ anya

Egbe igwe na amụma mmiri egbuola ihe ruru mmadụ iri ise, merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ ma mebisịa ihe n'India.

Nke a mere ka oke ifufe aja gbuchara ihe karịrị mmadụ otu narị na mpaghara ugwu India n'izu ole na ole gara aga.

N'egwuregwu Serena Williams ekuliela ọzọ

Nwaada eji egwuregwu tenis mara bụ Serena Williams sị na uwe o yi pịa bọọlụ ụnyaahụ mere ya ka ọ dị ka agụ nwaanyị

Serena meriri Kristyna Pliskova ụnyaahụ n'asọmpi French Open.

Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ụmụ Naịjirịa kwuru maka ọchịchị onye kwuo uche ya