Etu ndị ọwụwa-anyanwụ si mee 'Ụbọchị Biafra' ụnyaahụ

Faulks road Image copyright Emmanuel Izuchukwu
Nkenke aha onyonyo Ụzọ Faulks dị n'Aba tọgbọrọ chakoo nke mere na ndị mmadụ nwere ike gbaa bọọlụ ebe ahụ

Ụbọchị Mee 30 nke 1967 bụ ụbọchị Chukwuemeka Ojukwu kwuru na mba ọzọ akpọrọ Biafra. Ụbọchi ahu bụkwa oge ndị di icheiche na-akwado Biafra wepụtara ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ha iji cheta mbido Biafra na ndị nwụrụ n'agha agafeela, mana ndị mmadụ e gere ha ntị?

N'afọ a, maka mmachị ndị gọomentị machịrị Indegineous People of Biafra (Ipob) na ọchi cho a na-acho onyeisi ha bu Nnamdị Kanu mere ka ndi mmadụ tụwa anya etu emume ncheta Biafra ga-adị.

Lee otu ụbochị ahụ siri ga na steeti dị icheiche na ụwụwa anyanwu Naịjirịa:

N'Enugwu steeti

Ụfọdụ ndị nọ n'ụlọ ebe ndị ọzọ kwụdosiri ike ma mepee ụlọ ahịa ha ebe ndị ọrụ bekee gakwara ọrụ.

Ụlọakụ gbapere ebe ụlọọrụ ndi gọọmentị nọkwa ọrụ.

Ụfọdụ ahịa gbapere, mana Ọgbete, bụ nnukwu ahịa n'Enugwu azụghị.

Nsụka esoghi mee ya bụ nọrọ n'ụlọ.

Nkenke aha onyonyo N'ụzọ Ogui ụfọdụ ndị emepeghị ahịa ha, ebe ndị ọzọ mepere naanị nke dị n'ihu ụlọ ha
Nkenke aha onyonyo Ahịa kacha nnukwu n'Enugwu bụ Ogbete dị ka ebe agbara ọsọ. Naanị mkpụrụ mmadụ ole na ole mepere ahịa.

N'Abịa steeti

Ebe ndị bi n'Aba kwere nọrọ n'ụlọ, ndị bi n'Umuahia bụ isi obodo steeti ahụ gawaara onwe ha ka e nweghị ihe na-eme.

Ndị ụlọakụ na ndị ọrụ bekee mepere n'Umuahia.

Image copyright Akachi Okoro
Nkenke aha onyonyo Ụlọakụ dị n'Umuahia rụrụ ọrụ etu ha kwesịrị
Image copyright Emmanuel Izuchukwu
Nkenke aha onyonyo Ụzọ Faulks dị n'Aba tọgbọrọ chakoo nke mere na ndị mmadụ nwere ike gbaa bọọlụ ebe ahụ

N'Anambra steeti

N'agbanyeghị na ndị nọ n'ọchịchị n'Anambra nyere iwu sị na onye ọbụla ga-aga ọrụ ya etu o kwesịrị, ndị mmadụ egeghị ha ntị ma nọrọla onwe ha n'ụlọ.

Nnewi na Onịca sonyere na nọrọ n'ụlọ a, mana Ọka, bu isi obodo Anambara, esonyeghi ruo n'isi.

Image copyright Tonie Iwoba
Nkenke aha onyonyo Akwa mmiri Niger tọgbọ chakoo n'agbanyeghị na ọ bụ ebe ụgbọala na-ejukarị na-ebute ịga nwayọ nwayọ
Image copyright Tonie Iwoba
Nkenke aha onyonyo Okporoụzọ dị n'Ọnịcha tọgbọ chakoo

N'Imo steeti

Na steeti niile dị n'ala Igbo, Imo steeti so n'ebe ọtụtụ ndị mmadụ ejịghị ị nọ n'ụlọ were mee emume ncheta Biafra.

Kọmishọna ndị uweojii kwuru na e nweghị ihe dị otu ahụ mere n'Imo steeti.

Image copyright Vivian Duruaku
Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ juru n'ụlọakụ dị n'Owere
Image copyright Vivian Duruaku
Nkenke aha onyonyo Ụzọ cherubim Junction dị na Wetheral n'Owere kworo ekwo maka na ndị mmadụ pụtara n'ezi

Na Rivas steeti

Ụfọdụ ahịa na Rivas steeti emepeghị, mana ụlọakụ na ndị ọzọ zụrụ ahịa.

Nkenke aha onyonyo Eke Obigbo dị na Rivas steeti tọgbọrọ chakoo ka ndị mmadụ kwere nọrọ n'ụlọ
Image copyright Eze Ndu
Nkenke aha onyonyo Ahịa ọgbọ osisi dị na Obigbo emepeghị maka na ndị mmadụ kwere nọrọ n'ụlọ

N'Ebonyi steeti

N'ọtụtụ akụkụ Ebonyi steeti ndi mmadu putara etu ha na-eme na mbụ maka na gọvanọ ha bụ Dave Umahi nyere iwu sị na onye ọbụla ga-agara onwe ha mkpa ha ma gakwaa ọrụ ha etu o kwesịrị.

Mana ihe akara ndi Radio Biafra dere na Twitter na-atu aka na o nwere ndị sara oku ndị nkwado Bịafra ma mekwa etu ha kwuru.

Lee etu osiri ga ụnyaahụ:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: