Buhari ebinyela aka n'iwu #NotTooYoungToRun

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, Bashir Ahmad / Twitter

Nkọwa foto,

Ihe a bụ nnukwu ihe mere maka ndị ntorobịa ga-enwe nnukwu ohere ịzọ ọchịchị dịka mba ndị ọzọ n'ụwa

Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-akwado ndị ntorobịa ịzọ ọchịchị na Naịjiria nke a kporo #NotTooYoungToRun.

Onye ndụmọdụ onyeisiala n'ihe gbasara ụzọ mgbasaozi ọgbabara ọhụrụ bụ Bashir Ahmad kwupụtara nke a n'akara Twitter ya nakwa Facebook.

Bashir kwuru na onyeisala edewaala ndekọ maka iwu a o binyere aka ma kelee ndị ntorobịa niile na Naịjirịa na ndị niile kwadoro ya bụ akwụkwọ iwu.

O gosikwara ọtụtụ ndị gara n'isi ụlọọrụ Naịjirịa n'Abuja ikele onyeisiala maka iwu ahụ nke ga-enye ndị ntorobịa ohere iso zọọ ọchịchị n'ikike dị icheiche.

Bashir Ahmad dere n'akwụkwọ iwu ahụ enyela ndị ntorobịa mmeri.

Akwụkwọ iwu a na-ebudata afọ e ji azọ ọkwa dị icheiche na Naịjirịa site n'ọkwa onyeisiala, ndị gọvanọ, ndị nnochite anya sineti na ndị ụlọomeiwu nta nakwa nke steeti.

Site n'iwu a, a ga-ebudata afọ e ji azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa site n'afọ 40 gaa afọ 30 ebe nke gọvanọ ga-esi n'afọ 35 budata ya n'afọ 30.

Ọkwa ndị ọzọ dịka ndị sineti si n'afọ 35 gbadata n'afọ 30 ebe ụlọomeiwu nta sitere n'afọ 30 bata 25 etu ahụkwa ka nke ụlọomeiwu steeti dị.

Iwu a na-akwadokwa ndị na anọghị na otu pati ọbụla ịzọ ọchịchị n'onwe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: