Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena Williams awakela ọzọ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Serena Williams awakela ka anyanwụ ọzọ

Nkenke aha onyonyo Serena gbara dị afọ 36 nọzi na agba nke atọ na French opun

Agbara nwaanyị na egwuruegwu tennis bụ Serena Williams sị ụwa chere aka ghọrọ ya na ọdịnihụ.

Serena bụ onye meriri Ashleigh Barty nke mba Australia sị na ya ga-emecha sịe ike karịa ka ya dị bụ tupu ya amụọ nwa bụ nke sechituru ya nwaazụ na-egwu.

Rochas anọghị n'ọgbakọ APC

Image copyright Rochas/Twitter
Nkenke aha onyonyo Owelle Rochas bụ Gọvanọ Imo Steeti

Achọrọ Owelle Rochas achọ na ọgbakọ ndị APC n'Abụja ụnyahụ ebe ọtụtụ ndị isi ọzọ ndị pati ahụ zuru na ya bụ ọgbakọ

Owelle sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya bụ onyeisi pati ahụ na ọwụwa anyanwụ a nọghị ya. Cheta na Rochas na ndị pati ya malitere ịnwe ọgbaghara nsonso a.

Boko Haram agbuola ndịagha ise na Boronu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha ka na-ebuso Boko Haram agha n'ala Naịjiria

Na Boronu steeti unyahụ, ndị Boko Haram wakporo ma ta isi ndị agha Naịjirịa ise.

Texas Chukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuputara nke a mgbe ọ sị na ndị omekaome a basara ndị agha operation Lafia dole ọgụ mgbe ihe a mere.

Nkatọ esochiela mbuli ụtụisi ngwa ahịa igwe Trump

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Donld Trump

Nkatọ esochiele ụtụisi nke onyeisiala Trump nke Amerịka tinyere na-azụm ahịa igwe ndị mba ọzọ.

Trump weliri ụtụisi ngwa ahịa na-aka mba EU, Canada na Mexico bụ ndị fooro ntutu ta na ha ga abọrọ mbọ.

Gee nkeji ụtụtụ tata:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBiafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a