Nwaanyị gburu di ya o nwere ngọpụ n'iwu?

Ikpe nkwụmọtọ

Onye ọkaiwu na Legos bụ Ebuka Iwuezi ekwuola na nwaanyi gburu di ya ebe ọ na-azo onwe nwere ngọpụ n'ụlọikpe ma ọ bụrụ na o nwere ike igosi na ọ bụ ka ọ na-azọ onwe ya ka ọdachi ahụ mere.

Ụnyaahụ ndị uwe ojii nwụchiri otu nwaanyi a kpọrọ Akinbobola Olamide, onyenkụzi sugburu di ya, Akinbobola Dare n'Ikorodu, Legọs, ebe ha na-enwe nsogbu ezinaụlọ.

Nwaanyị ahụ ji ụmụ abụọ nọrọ na ihe onyonyo na-efeghari na sochal midia na-ebe sị, "Amaghị m ụma gbuo ya."

Akwụkwọ akụkọ Vanguard kwuru na ụfọdụ ndị agbataobi di na nwunye ahụ gwara ha na- nwoke ahụ na-etikarị nwunye ya ihe.

Ha kwukwara na ndị mụrụ nke nwaanyị gwara ya ka ọ gbahapụ dị ya ma nwaanyị jụrụ ị hapụ di ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị

N'okwu ya , Ọkaiwu Iwuezi si: "Ọ bụrụ na Maazi A na-ebuso Maazi B agha nke na ọ na-achọ igbu ya, Maazi B nwere ike ime ihe o kwesiri ime iji zọta ndụ onwe ya."

"O mee otu a, a ga-anabata ihe o mere n'iwu dịka ịzọ onwe(self-defence)."

Mana Iwuezi kọwara na omeeabụghị ya dị n'okwu ahụ bụ na "Ihe i mere onye na-ebuso gị agha ga-aha nhatanha na ihe ọ chọrọ ime gị."

Ọ bụrụ na ezie di chọrọ ịtogbu nwunye ya ọ na azọ onwe ya, mma rute ya aka ọ zugbu ya, o nwere ngọpụ n'ihi na nwoke ahụ na-atọgbu ya achọghị ya ndụ."

Okwu a bilitere ndoritaụka na socal midia.

Ebe ụfọdụ na-emere nwaanyị ahụ ebere, ụfọdụ na-egosi iwe ha.

N'okwu ya onye kpọrọ onwe ya Scilla kwuru na a na-akpọkarị ụmụnwaanyị ajọọ aha oge ọ bụla ha na-azọ onwe ha maọbụ nwoke na-eti ha ihe.

Ebe Shehu BelloOlayinka na-ewe iwe sị na anaa zotara ụmụnwaanyị nke bụ na ha gbuo di ha, a si na ọ bụ maka mkpagbu na mmegbu, nwoke gbu nwunye ya, a sị na ọ bụ oke iti ihe.

Ụmụnwaanyị gburu di ha

Na nsonso, nwaanyị igbu di ya bụ nsogbu na-arị elu.

Ụfọdụ akụkọ nwaanyị gburu di ya fesara na Naijiria na nsonso gụnyere:

1. N'afọ 2016 Yewande Oyediran onye ọkaiwu gburu di ya, Lowo, n'Ibadan

2. N'afọ 2017, Maryam Sanda gburu di ya, Haliri Bello n'Abuja

3. N'ọnwa Mee afọ 2018, otu ọkaiwu, Udeme Odibi gbukwara di ya Otike na Legos.

Gịnị mere nwaanyi igbu di ya ji ari elu?

Iwuezi kwuru na ọ bụ nsogbu ezinaụlọ ya na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ediwuzi ihe.

Ọ gara n'ihu dụọ di na nwunye ọdụ:

" Ọ bụrụ na ịgaghị edinwu ihe na-eme, gbaa alụkwaghị kama ị nọrọ ihe ọdachi eme."

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a