Fayemi: Kedu ihe mere n'emume ndi APC n'Ekiti

Kayode Fayemi Image copyright Kayode Fayemi/Facebook
Nkenke aha onyonyo Fayemi Chịbụrụ Ekiti site afọ 2010 ruo afọ 2014

Ndị otu pati All Progressive Congress (APC) nke Ekiti steeti na-ekwu na ọgbaghara mere n'ebe ha na-eme ọgbakọ ha jiri nabata Kayode Fayemi, bụ onye bụbụ Mịnịsịta na-ahụ maka ọla na ihe ndị ọzọ a na-egwupụta n'ala bụ ohere ndị mmadụ jiri chọ igbu Fayemi.

Na akwụkwọ mgbasaozi APC Ekiti weputara n'abalị ụnyaahụ, onye na ekwụchitere ha bụ Taiwo Olatunbosun kwuru:

"Ndọrọndọrọ ọbara alagachitela Ekiti, ka Kayode Fayemi zere ogbugbu a chọrọ igbu ya n'Ado-Ekiti, isi obodo Ekiti steeti.

"Fayemi rituru n'ọkwa dịka Minista n'ụbọchị Wenezde were lata Ekiti ka ndị APC na-emere ya mmemme.

"Site ọdọ ụgbọelu nke Akure ruo Ikere-Ekiti, ebe mmadu puku na puku nọ na-eche ya pụtara nabata ya nke ọma, nsọgbụ adịghị. Ọ bụ mgbe ọ gara Adọ-Ekiti, n'ụlọ otu ndị APC ka onye yi uwe ndị uweojii gbapụrụ egbe n'etiti Fayemi, mgbo metụtara Opeyemi Bamidele na ndị ọzọ."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere n'Ekiti steeti. Onye sere ihe nkiri a bụ olasunkanmi ogunmuko

Akwụkwọ ozi a gakwara n'ihu kọwa na e buru Bamidele na ndị ọzọ mgbo metụtara gawa ụlọọgwụ mmụta nke Mahadụm Ekiti steeti di kwa n'Ado-Ekiti.

Ndị ọzọ mgbo metụtara, dika Olatunbosun siri kwuo, bụ Olabode Joshua, Olanrewaju Gbenga, Adebayo Ogunjemilehin, Ogunmodede Oluwole na Alex Adeleye.

Ndị APC tinyere ọnụ na ya bu okwu na Twitter.

Mana, ndi uweojii na-akọwa na ọbụghị eziokwu na onye ahụ yi uwe ndị uweojii bịara igbu mmadụ. Na nkọwa ha, ha kwuru na onye ahụ yi uwe ndi uweojii bu onye uweojii n'ezie.

N'okwu ha, onye uweojii ahụ soro onye ndọrọndọrọ si Legọs bịa Ekiti. Ha kwukwara na ọbụghị anya ọma ka ọ jịri gba egbe a, na ọ bụ mmehie.

Ndi uweojii kwukwara na ha na-eme nyocha maka ihe mere.

Cheta na Fayemi ga-azọ ọchịchi ka gọvanọ steeti ahụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julai afọ a.

Fayemi chịbụrụ steeti ahụ ka gọvanọ site 2010 ruo 2014.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a