Ndị ọchịehi a ga-abụ ndị oyi egwu ka ha agaghị abụ?

onye ọchịehị na ehi ya. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa

Ụlọikpe nọ n'Abuja ga-ebido ụbọchị Juunu 12 ikpe ikpe banyere ma a ga-akpọ ndị ọchịehi otu na-eyi ọha egwu ka agaghị akpọ ha.

Onye gbara akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe na-achọkwa ka a kwụsị ihe niile ndị ọchịehi na-eme na Benue steeti nke butere ogbugbu na mmemina ha kpachara anya na-eme na steeti ahụ.

O kwuru na ndị ọchịehi kpachara anya na-egbu ndị mmadụ, na-emebi ngwongwo ha ma nke mmadụ nwe na nke gọọmenti nwe, gụnyere ịchụpụ ndị mmadụ n'ụlọ ha nakwa imebi ma ụlọọgwụ, ahịa na ihe ndị ọzọ.

Onye gbara akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe bụ onye ọkaiwu bi na Makọdị bụ isi obodo Benue steeti aha ya bụ Matthew Nyiutsa.

Nyiutsa na-achọ ka ụlọikpe nye onyeisala Muhammadu Buhari na onye ọkaiwu ukwuu nke Naịjirịa iwu ka ha kpọọ ndị ọchịehi na otu Miyetti Allah Kautal Hore otu na-eyi ọha niile egwu.

Ọkaikpe na-ahụ maka ikpe ahụ bụ Gabriel Kolawole tinyere ụbọchị 12 Juunu maka ikpe ahụ.

Ọkaiwu Nyiutsa chọkwara ka a kwụọ ndị niile mkpamkpa ndị ọchịehi metụtara ego ruru nde naịra 50 ebe a ga-ekwupụta na mwakpo niile ndị ọchịehi na-eme kamgbe ụbọchị mbụ ọnwa Jenuwari afọ a n'okpuruọchịchị Guma, Logo, Makọdụ, Gwer-East, Buruku, Tarka, Katsina-Ala na Ukum dị na Benue steeti bụ ọrụ otu na-eyi egwu dịka iwu ịchụ ụdị otu a nke afọ 2011 si kwuo.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Plateau sị Buhari ya ritue n'ọkwa ọchịchị maka mwakpo ndị ọchịị̄hi

Dịka o si kwuo, n'afọ 2014, ndị ọchịehi gburu mmaọ̄ụ itoolu n'ime ezinaụlọ ya ebe ha gburu mmadụ 24 ndị ọzọ ụbọchị mbụ ọnwa Jenụwarị afọ a na Tom-atar.

O tinyere akwụkwọ ọnwụ na akwụkwọ ndị ọrụ ahụike nakwa akwụkwọ eji lie ma kwaandị ahụ ndị ọchịehi gburu.

Ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo na-akwata ya na steeti Benue, Taraba, Krọs Riva, Enugu na Platu na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: