Akụkọ kachasị n'abalị a: Boko Haram egbuola ndị mmadụ na Zamfara
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Boko Haram egbuola mmadụ iri na ise na Zamfara
Ebe foto si, Reuters
Ndị obu egbe a na-eche na ha bụ Boko Haram mmadụ iri na ise n'obodo Zakuna dị na Zamfara Steeti.
Onye na-ekwucite ọnụ ndị uweojii na steeti ahụ Muhammad Shehu kwuru na ndị wakporo Zakuna n'isi ụtụ ụnyaahụ.
Aka akparala nwoke gburu nwa ya nwaanyị
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị ahụ kugburu nne di ya
Aka akparala otu nwoke akpọrọ Cletus Aguluka, gbara afọ iri isii n'obodo Awgbu dị n'Orumba North nke Anambra Steeti.
Nwoke a bụ onye ji mma magbuo nwa ya nwaanyị bụ Onyinye Aguluka dịka ọ na-ehi ụra.
Ndị uweoji kwuru na nyocha ka na-aga n'ihu ugbu.
Akụkọ mba ofesi
E duola onyeisiala mba Ejipt n'iyi ọrụ
Ebe foto si, AFP
N'aka nke ọzọ eduola Abdel Fattah al-Sisi n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Egypt nke ugboro abụọ dịka ọn̄ụrụ iyi ikpochapụ ndị na-eyi ndụ egwu.
N'ọzọ;
Ọrịa ebola ka na amụba na mba Kongo dịka Mịnịstry ahụike ha ekwuola na-enwela mmadụ ise ọhụrụ ometụtara na mpaghara ugwu nke mba ahụ
Cheta na ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise anwụọla site n'ọrịa kamgbe ọ malitere nke ugbu abụọ.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Carl Ikeme ritere ihe akpọrọ 'ọkacha agba n'egwuregwu' mgbe Naịjirịa malitere njem iko mba ụwa
Onye na-agbara Super Eagles bọọlụ bụ Moses Simon na ogbo ya na-echeche bụ Carl Ikeme ekwupụtala nwute dịka ndị na agaghị e so n'asọmpi iko mba ụwa.
Ha gaara n'ihu kele ndị nkwado ha make ịhunnaya e gosiri ha n'ute ọrịa ha dị iche iche.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu