Akụkọ kachasi n'ututu a: IPOB akatọla gọvanọ Dave Umahi nakwa Willie Obiano

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

IPOB akatọla gọvanọ Dave Umahi nakwa Willie Obiano

Biafra na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ahụbeghị onyeisi Ipob bụ Nnnamdi Kanu kamgbe awakpochara be nna ya n'Umuahia

Otu so azọ nwereonwe Biafra akpọrọ Indigenous People of Biafra (IPOB) akatọla gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi nakwa nke Anambra steeti bụ Willie Obiano maka mgbochi ha mere gbasara 'onye nọrọ n'ụlọ ya' nke ha mere ụbọchị Mee 30 garaaga.

Ipob kenere gọvanọ asaa na-achị n'ọwụwa anyanwụ nakwa ndị na-achị n'ọdịda anyanwu maka nkwado ha nyere ha gbasara ya bụ emume.

FAAN ga-ebido nyocha ahụ zuruoke n'ụlọ ụgbọelu anọ dị Naijiria

Ndị njem
Nkọwa foto,

FAAN kwuru na ha na-eme nyocha ahụ n'ụlọ ụgbọelu ndị a makana ha bụ ebe ndị mmadụ na-ejupute karicha

Ngalaba n'ahụ maka ihe gbasara njem ụgbọelu na Naịjiria akpọrọ FAAN n'ichafu ekwuola na o bidola nyocha ahụ zuruoke n'ụlọ ụgbọelụ anọ dị na Naijiria.

Ụlọ ụgbọelụ ndị a gunyere Murtala Muhammed International Airport dị na Lagos, Nnamdi Azikiwe International Airport, Abuja, Mallam Aminu Kano International Airport, Kano, na Port Harcourt International Airport.

Na mba ofesi,

Theresa May

Ebe foto si, Getty Images

Aka na-achi Briten bụ Theresa May ekwuola na mkpebi obodo ya imeri ndị oyi egwu esiela ezigbo ike ụgbua kamgbe awakpochara ụmụ Briten n'akwa London.

A ga-edo ofufe nru n'ụlọ ụka Southwark maka mmadụ 8 nwurunụ na ya bụ nwakpo iji wee mee ncheta ụbọchị ahụ taa.

Cheta na mmadụ 8 nwụrụ mgbe nwoke atọ nọ n'ụgbọala sugburu ndị mmadụ na ahia Borough n'ọnwa June 3 n'afọ 2017.

N'egwuregwu bọọlụ,

Super Eagles

Ebe foto si, @BBCMOTD

Nkọwa foto,

Alex Iwobi bụ onye mbụ na-enye mba England goolu na Naịjirịa

Onye nkuzi otu na-agbara Naijiria boolu bụ Gernot Rohr ekwuola na ndị otu Super Eagles adịchaghị nkwadobe maka iko mbaụwa ma kwukwa na Simeone Nwankwo ga-eso na ndị ọhụpụtara maka i ga Russia.

Cheta na England ji ọkpụ goolu abuọ asatara otu wee merie Naijiria na Wembley ụnyahụ.

Gee nkeji ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu

Akụkọ ndị ga-amasị gị: