Ejima kpụkọtara ọnụ anwụọla na Tanzania

Maria na Consolata Mwakikuti
Nkenke aha onyonyo Maria na Consolata kwuru okwu ị lụ di mgbe ha ka nọ ndụ.

Maria na Consolata Mwakikuti bụ ụmụ ejima kpụkọtara ọnụ anwụọla site n'ọrịa mkpụrụ obi na mba Tanzania.

Ụmụ nwaanyị ahụ kpụkọtara ọnụ site n'otubo gbadaa nwere otu umeju na otu akpa ume kama ha nwere mkpụrụ obi abụ na aka dị ịcheiche.

Ha gara ụlọọgwụ dị n'obodo ha n'ọnwa disemba maka nsogbu mkpụrụ obi tupu ha anwụọ ụnyaahụ bụ Satode.

Akụkọ ọnwụ ha butere oke mwute na mba Tanzania n'ihi na ha bụ ndị ama ama ma hụ kwa na-anya nke ukwuu.

Onyeisiala mba Tanzania John Magufuli dere n'elu Twitter n'ọnwụ a wutere ya nke ukwu n'ihi na ejima ahụ chọrọ ị fee ala ha.

Lee ebe Magufuli kwuru nke a ma na-eti ezinaụlọ ha aka n'obi maka ọnwụ ejima ahụ:

Maria na Consolata jụrụ atụmatụ ọbụla ikewa ha site n'ọwụwa ahụ, ma na-ekwu "anyị nwere olileanya ị lụ otu di n'oge adịghị anya"

Mgbe BBC gbara ha ajụjụ ọnụ n'afọ 2017 ha kwuru na ha chọrọ ị bụ ndị nkuzi ma ha gụchaa Mahadum.

Ọ bụ ndị enyemaka ụka Katọlịk Maria Consolata zụrụ ha ebe nne na nna ha nwụrụ mgbe ha ka dị obere.

Igwe mmadụ zitere ha ozi ekele n'afọ gara aga ha gụchara akwụkwọ sekọndrị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a