Akụkọ kachasị n'abalị a: A bụghị m ogbu mmadụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Asịghị m na m gburu ndị mmadụ na PDP - Kalu
Ihe Kalu kwuru maka PDP
Orji ụzọ Kalu onye bụbu Gọvanọ Abia Steeti n'oge gara aga agọrọla aka ya n'akụkọ na-ekwu na o gburu ndị mmadụ mgbe ọ nọ n'otu PDP.
Kalu kwuru na ọ bụ nghọtaghe ka ndị mmadụ nwere n'azịza ọ zara n'ihe onyonyo ahụ na-agagharị.
Ebola Saraki ebubo mpụ na ohi ma kpọọ ya n'ụlọ ndị uweojii
Ndị uweojii akpọla onyeisi ndị Sịnetị bụ Bukola Saraki ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo mpụ na ohi karịasịa ohi ezuru n'ụlọakụ dị n'Offa kwara State
Ebe ọnụ kwuru Saraki bụ Yusuf Olaniyonu kwuru na ha ga-azaghachị nke a n'oge na-adịghị anya.
Akụkọ mba ofesi
Ụmụejima kpụkọtara ọnụ anwụọla na Tanzania
Na Tanzania, Ụmụejima abụọ kpụkọtara ọnụ akpọrọ Maria na Consolata anwụọla dịka ha gbara afọ iri abụọ n'otu.
Ejima abụọ ndịa bụ ndị nwere otu imeju na otu akpaume nwụrụ site n'ọrịa obi.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, @NGSuperEagles
Onye nchịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr akpọpụtala aha mmadụ iri abụọ na atọ ga-agba asọmpi iko mba ụwa.
Ụmụafọ Igbo gbapụtara ihe na ndị a gụnyere Mikel Obi, Kelechi Iheanacho, Alex Iwobi, Ikechukwu Ezenwa na ndị ọzọ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu