Triplets after 19 years: Ị hụtụla ụdị ọrụ ebube a?

Mgbe Pastọ Don Ọdụnze na Oriakụ ya bụ Ogechi Ọdụnze chere na oge ịmụ nwa ha agafela, ha mụrụ ejịma atọ, ụmụ nwoke abụọ na otu nwanyị.

Mgbe BBC Igbo bịara n'ụlọ ya n'Enugwu, Pastọ Ọdụnze jiri egwu ọṅụ na-eto Chukwu ma nyekwa ndị na-achọ nwa ndụmọdụ ka ha tụkwasa chukwu obi n'ihi na ọ naghị agharịpụ onye ọbụla tụkwasịrị obi na ya.

Nne Ejima atọ Ogechi Odụnze kọrọ ka ụmụ nwaanyị ibe ya siri na-eme ya akaja na ya na dị ya na-ekpere ndị ọzọ ekpere mana ha apụghị ikpepụta onwe ha.

Don Odunze na Ogechi nwunye ya nọzị ugbua na-enwere aṅụrị.

Akụkọ ga-amasị gị: