Gọọmenti na-ebido ịna ego e tinyere n'ụtụ mmanya ọkụ na anwụrụ taa

Anwụrụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naanị ndị rugoro afọ iri na asatọ kwesiri ịse anwụrụ na Naịjirịa

Gọọmenti etiti ga-amalite taa ịna ụgwọ ụtụ ọhụrụ e tinyere na ngwọahịa mmanya ọkụ na anwụrụ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ iwu tinyere ego n'ụgwọ ụtụ dị n'anwụrụ, mmanya biya, mmanya wain, na mmanya ọkụ e si mba ofesi bubata mana o nyere amara mkpụrụ ụbọchị 90.

Nke a na-eso akwụkwọ mịnịsịta okwu ego dị n'aka bụ kemi Adeosun degara onyeisiala Buhari ka o nye iwu ka e bido ya bụ iwu.

Adeosun kwuru n'akwụkwọ iwu ahụ na mmegharị iwu ahụ ga-ebido afọ 2018 rue afọ 2020 iji belata mmetụta o nwereike imetụta ngalaba ahụ.

Dịka o si kwuo, ajọ ọrịa anwụrụ na mmanya ọkụ na-ebute ga-ebelata site n'iwu ọhụrụ a.

Ego e tinyere n'ụtụ a bụ iji kwado iwu ọhụrụ ECOWAS nke a na-ele anya ga-ewelite ego gọọmenti na-enweta ma belata mmebi ya bụ ngwọahịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: