Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị ụkọchụkwụ emela ngagharị iwe n'Owerri

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Ndị ụkọchụkwụ Katọliki gosiri iwe ha maka ndị otu ha egburu na Benue

Image copyright Ebere Ekeopara
Nkenke aha onyonyo Egburu ndị ụkọchukwu katọliki abụọ na Benue steeti na onwa Aprelu afọ a.

Ndị ụkọchụkwụ ụka Katọlịk na ọwerrị mere ngagharị iwe ụnyahụ iji dọta echịche ndị gọọmentị Naijịrịa maka ndị otu ha egburu egbu na Benue.

Ndị ụkọchụkwụ kwuru ka onyeisiala Buharị gbambọ chọpụta ndị merụrụ ala ahụ ma taa ha ahụhụ ka osikwesi.

Buhari sị na-emeere Biafra Ebere

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agha Biafra tara isi ihe karịrị nde atọ

Nwafọ Igbo bubu minista ahụike bụ Prof. Alphonsus nwosu agwala onyeisiala Buhari ya ga gbara ogwu ya nụọ.

Onyeisala Buharị kwuru na Yakubu Gowan bụ onye amị chịrị Naịjirịa mgbe agha

Biafra rịọrịọ ndị agha ha mgbe ahụ ha emesikwala ndị Igbo ike.

Akụkọ mba ofesi

Ọgbatauhie dakwasịrị mba Guatemala

Image copyright Guatemala Government
Nkenke aha onyonyo Fuego volcano has been spewing ash and smoke

Akụkọ ọkụ na-abọpụta n'ala nke mere na Guatemala ụbọchị ụka akwụsịbeghị o.

Ka ọdị ụgbụa achọpụtala na ya bụ ọkụ mmụọ ataala isi mmadụ iri assa na ise (75) ma merukwa ihe uru mmadụ narị abụọ ahụ. Mmh ọga dịcha mma.

N'egwuruegwu,

Image copyright Super Eagles/twitter
Nkenke aha onyonyo Super Eagles gbatiri ọkpa maka egwu bọlụ asọmmpi iko mba uwa nke mbụ n'Austria na 4 Juun.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Lee ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGoolu kachasị n'asọmpi iko mbaụwa

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a