Mmadụ 15 anwụọla na 'mwakpo ndi ọchị ehi' na Benue steeti

Mwakpo Benue Steeti Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A wakporo obodo ise n'ime Guma LGA nke Benue Steeti

Ihe ruru mmadụ 15 nwụrụ na Benue steeti na mwakpo dị icheiche ndị omekome mere n'ime obodo Benue steeti, ka ndị gọọmentị steeti ahụ siri kwuo.

Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi wakporo ime obodo di icheiche n'ime abali abụọ, onye na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lawrence Onoja kwuru.

A wakporo obodo Tse Ishav, nke dị nso na obodo Guma, na isi ụtụtụ Wenesde. Mmadụ asatọ nwụrụ ka a na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ ka ọtụtụ ndi ọzọ merụrụ ahụ.

Mwakpo a mere ka abalị abụọ gara mgbe ndị oji egbe gbụrụ mmadụ abụọ n'etiti Yelwata.

Aka na-achị ọchịchị obele obodo Guma bụ Anthony Shawon kwenyere na mwakpo a mere ma kwuo na mmadụ 10 nwụrụ tinyelu ụlọ na ugbo agala ọkụ.

Ndị omekome mere mwakpo a gakwara n'ihu wakpo obodo Logo were gbuo mmadụ ise ma merụọ ndị ọzọ ahụ, Onoja kwụrụ.

Ogbaghara dị n'etịtị ndị ọkọ ugbo na ndi ọchị ehi na Benue ebutela ogbugbu mmadu na mmebi akụnụba na ebe dịicheiche na steeti ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a