Iwu Naịjirịa akwadoghị ugo Buhari tụnyere Abiola - Okaikpe Belgore

MKO Abiola
Nkọwa foto,

Abiola bụ onye a na-eche na ọ bụ ya meriri ntuliaka nke Juun 12 1993

Onye bụbụ ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa bụ Alfa Belgore, kwuru na nkwanye ugwu na nturuugo onyeisiala Muhammadu Buhari nyere MKO Abiola adabaghị makana iwu obodo akwadoghị ya.

Na nghọta Belgore, bụ nke o kwuputara n'ajuju ọnụ ndị ụlọ ntaakụkọ Premium Times gbara ya, iwu obodo ekwughi na a ga-enye onye nwụrụ anwụ nturuugo nke akpọrọ GCON.

Mana ndị ọnụ na-eru n'ọkwu etinyela ọnu n'ihe Belgore kwuru.

Mmadụ dịka Abdul Mahmud bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye aka ya dị n'ihe banyere Juun 12 (bụ mgbe emere ntuliaka nke 1993 nke a na-eche na Abiola meriri) kwuru na okwu ọkaikpe ukwu a adabaghị.

N'ihe o dere na Facebook, Mahmud sị na iwu kwuru na onyeisiala nwere ikike inye nturuugo etu ọbụla o siri chọọ. Na nkọwa ya, iwu itu ugo nke ehiwere n'afọ 1964 kwadoro ya.

Mana onwere ndị kwadoro ihe Belgore kwuru, dika Maazi Kennedy Emetulu bụ onye kwuru na ihe ọkaikpe ochie a kwuru kwụ ọtọ.

Anyị gbara mbọ ịnweta ọnụ okwu ndị gọọmentị n'okwu a mana ndị anyị kpọrọ azaghị ekwenti ha.