GTB asaala akụkọ gbasara ikpe Innoson

Innoson na-arụpụta ụgbọala dị ịcheịche

Ebe foto si, Innson Group

Nkọwa foto,

Onye ọkaịkpe ji okwu ekwuola na ọ wepụla aka ya n'ihe gbasara okwu a

Ọnụ na-ekwuchitere GTbank bụ Oyinade Adegbite ekwuola na akụkọ kwuru na Ụlọikpe tụghapụrụ arịrịọ ha ka a kagbuo mkpebi ụlọikpe mkpegharị nyere ka a kwụọ Innoson ụgwọ abụghị eziokwu.

N'okwu ya, Adegbite sịrị na ihe ụlọikpe kachasị gwara onye ọbụla ikpe a gbasara bụ ka ha lọghachie n'ikpe bụ isiokwu nke dị n'ụlọikpe mkpegharị dị n'Enugwu.

Adegbite sịrị : "Ihe anyị rịriọ ụlọikpe bụ ihe gbasara ịkwụnye ụgwọ n'aka ụlọikpe mana ụlọikpe kpụpụrụ mkpesa niile gwa onye ọbụla ka anyị lọghachie na ụlọikpe mkpegahịrị maka isiokwu n'ikpe ahụ nke dị n'ụlọikpe mkpegahirị dị n'Enugwu ndị kpọrọla Innoson ugboro atọ mana ọ zaghị ha.

"Ụlọikpe ekwughị ihe ọbụla banyere GTBank ịkwụ Innoson ego ọbụla."

Akụkọ pụtara n'ehihie taa kwuru na Innoson eritela erere na mkpebi ụlọikpe kachasị (Supreme Court) na Naịjirịa kpebiri tata n'ikpe nke GTbank wegara ịma ma a ga-amachị mkpebi ụlọikpe mkpegharị (Court of Appeal) dị n'Enugwu mere nke kwuru ka ha kwụọ Innoson ego ruru ijeri naira ise.

N'akwụkwọ ọnụ na-ekwuchitere Innoson bụ Cornel Osigwe zitere ndi ntaakụkọ o kwuru na mkpebi a sitere na ikpe e kpere banyere ugwo Innoson kwuru na ụlọakụ GTBank ji ha site na nchabi ego eziezi ulọaku ahụ na-achabi n'ego ha.

Osigwe kwuru n'ụlọikpe nke ukwu kagbụrụ arịrịo GTbank rịrịọ ka ha ghara ịkwụ ụgwọ a.

Ozi a si Innosn kwuru na ọkachamara McCarthy Mbadugha bụ onye du ndị ọkaiwu Innoson gwara ndị ụlọikpe kachasị na ego GTBank ji Innoson bụ ijeri naira 14.

Cheta na ụbọchị 9 nke ọnwa Disemba afọ 2014, ulọikpe mkpegharị nke di n'Enugwu kpebiri na GTBank ga-akwu Innoson naira 5,936,126,219.01k. Enyere GTBank ụbọchị 14 ịkwụ ya.

Mana GTBank ekweghị na mkpebi a e nyere ma rịọ ụlọikpe kachasị ka o tinye mmachi na ikwụ ụgwọ a.

Ọnụ na'ekwuchitere Innoson kwuru na etu ha siri ghọta mkpebi a, GTBank nwere ụbọchị 14 ịkwụ ijeri naira 14 n'aka Deputy Chief Registrar nke ụlọikpe mkpegharị nke Enugwu.