Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Buhari agaghị atụpụrụ ndị omeiwu ọnụ - Garba Shehu

Akụkọ kachasị mere taa;

Buhari agaghị atụpụrụ ndị omeiwu ọnụ - Garba Shehu

Image copyright @Senatepresident

Onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onyeisiala aghaghị atụpụrụ ndị ụlọ omeiwu ọnụ na egwu ha na-eyi ịchutu ya n'ọrụ ma ọ bụrụ na ọ zaghị oku ha.

O kwuru nke a mgbe ha mechara mkparịta ụka ndị isi ọchịchị ụnyaahụ.

Ihe ruru mmadụ iri na ise anwụọla na Benue Steeti

Image copyright Getty Images

Ihe ruru mmadụ iri na ise anwụọla na Benue Steeti site na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ndị ehi mere na mpaghara dị iche iche n'ime abalị abụọ.

Kọmishịọna mgbasa ozi nke Steeti ahụ bụ Lawrence Onoja kwuru na na obodo ndị a gunyere Tsa Ishav, Yelwata na logo.

Onye bụbu ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Alfa Belgore ekwuola na iwu akwadoghị nkwanye ugwu nturugo Buhari nyere MKO Abiola.

Cheta na Buhari kwanyere Abiola ugwu ma mee abalị iri na abụọ n'ọnwa juun ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo oche ya.

Image copyright Getty Images

N'egwuruegwu,

Image copyright Getty Images

Nyocha onye ntaakụkọ mba Ghana mere gbasara iri aka azụ ndị na-egbu bọọlụ gosiri otu onye na-egbu bọọlụ mba Kenya bụ Aden Range Marwa dịka ọ na-anata ego dị narị dọla isii n'aka otu bọọlụ dị na Ghana.

FIFA ekwuola na nwa amadi a agaghị e so gbuo asọmpi iko mba ụwa na-abịa abịa.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Lee ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGoolu kachasị n'asọmpi iko mbaụwa