A tụola nwoke nga maka igbu ndị mụrụ ya, nwanne ya

Henri Van Breda,

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Van Breda kwudosiri ike na-ekwu na ọ bụ otu onye kpu ihe n'ihu kpara mkpamkpa ahụ

A tụọla otu nwoke nga mkpụrụọka maka igbu nne na nna ya nakwa nwanne ya nwoke na mba Saụt Afrịka.

Henri Van Breda,onye ji onike gbuo ndị ezinaụlọ ya n'ụlọ ha na Janụwarị afọ 2015 ga-agakwa mkpọrọ afọ iri abụọ na ise maka ịnwale igbu nwannne ya nwaanyị ọ tọrọ.

Oge a na-ekpe ya ikpe, Van Breda kwudosiri ike na-ekwu na ọ bụ otu onye kpu ihe n'ihu kpara mkpamkpa ahụ.

Na mkpebi o nyere n'ụlọikpe ukwu dị na Saụt-Afrịka ụbọchị Tọọsde, ọkaikpe Siraj Desai kwuru na mwakpo e mere ezinaụlọ Van Breda bụ 'ọchụ ka ọchụ.'

Ọkaikpe ahụ kwuru na nwoke ahụ egosighị nchegharị ọbụla oge niile ikpe ahụ na-aga nke o ji agwakwanụ onye ọbụla ihe mere o jiri gbuo ndị ezinaụlọ ya.

Mana ka o si dị, ụdị mwakpo a tụrụ ndị nyocha na ndị Saụt Afrịka n'anya.

Ọtụtụ na-eche na mkpebi a ụlọikpe nyere ga-abụ amamọkwa nye ndị ga-abụ ndị omekome.

Henri Van Breda, onye nke mara ihu akpụ oge ikpe na-aga, ga-agbagharị akwụkwọ mkpegharị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: