APC agwala Okorocha ka ọkwụsị ebo ndị isi ha ebubo

Owele Rochas Okorocha Image copyright BBC Igbo
Nkenke aha onyonyo Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo

Otu ndọrọndọrọ na-achị bụ All Progressives Congress (APC) adọla aka na-achị Imo steeti bụ Owelle Rochas Okorocha aka na ntị maka ebubo ha si na ọ na-ebo ndị isi otu pati ahụ.

Okorocha kwuburu na onye isi oche APC bụ John Odigie-Oyegun akwanyeghị iwu ọlụikpe nyere banyere ntuliaka a ga-eji họpụta ndị ga-achị pati ha na onye ga-azọrọ ha ọchịchị n'Imo.

N'akwụkwọ Bolaji Abdullahi bụ ode akwụkwọ mgbasa ozi nke APC dere, APC kọwara ebubo Okorocha boro ha ka ihe enweghị ụkwụ ọbụla, ma kwuo na ha enweteghị akwụkwọ si ụlọ iwu maka ị kwụsi ntuliaka ahụ.

Abdullahi kwuru "N'ịza ebubo aka na-achị Imo boro Oyegun na "ọkwanyeghị ụlọikpe ugwu" eziokwu adịghị na ya.

"Maka nke a, anyi na-agwa gọvanọ Imo ka ọkwụsị ebo ụdịrị ebubo a maka na ha abụghị eziokwu. Na-ime ntuliaka a na gbụrụgbụrụ Naịjirịa, na ị nyocha ha n'otu n'otu nakwa idu ndị ga-achi pati na steeti dị icheiche n'ịṅụ iyi, ndị na-ahụ maka ya bụ "National Working Committee" (NWC) soro usoro na iwu pati," Akwụkwọ mgbasa ozi a kwuru.

APC gara n'ihu nye Okorocha ndụmọdụ ka osoro usoro iwu ha kpesa nsogbu ọ bụla maọbụ ụzọ ọbụla esi megide ya.

Cheta na Okorocha na ụfọdụ ndị APC n'Imo steeti nwere nsogbu maka etu esiri mee ntulika iji họpụta ndị ga-achị pati ahụ n'Imo nakwa nkwado ọ na-enye ọgọ ya nwoke ị bụrụ aka ga-achị Imo ma ọ rituo.

Lee ihe ndị kpọrọ onweha "Restoration Group" kwuru maka ntuliaka a na Okorocha mgbe ha mechara nzụkọ n'Abuja n'ọnwa gara aga.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ndị "Restoration Group" kwuru

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a