'Ọtụtụ mmadụ kọrọ m ọnụ maka nwa' - Nne ejima atọ

Ụmụ ejima atọ Ogechi na di ya mụrụ Image copyright Don Odunze/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ụmụ ejima atọ goziri ezinaụlọ Dan na Ogechi Odunze

Nwaanyị mụrụ nwa ka ọchọchara nwa afọ iri na itoolu ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ kọrọ ya ọnụ nwa.

Ogechi Odunze, nwunye ụkọchukwu a ma ama bụ Don Odunze (Jnr) ritere ejima atọ na nsonso a.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Ogechi kwuru na ndị mmadụ mere ya akaje n'ihi amụtaghị nwa.

"Ọtụtụ ndị mmadụ kọrọ m ọnụ nwa. Ma ndị kpọrọ onwe ha ndị enyị m sị m na ọ bụghị itu fashọn ka m ga-eji mụta nwa.

Oriaku Odunze kwuru na ọtụtụ ndị ụkọchụkwụ gwakwara ya okwu ọjọọ.

N'ọnụ ya, "Ha sịrị m bịa ka ha gbanye m holi sidi (holy seed) n'ahụ.

"Agwara m ha sị, 'Tụfịakwa! Na ọ bụghị mụ na ha. Na holi sidi di m na enyeghị esighị n'aka Chukwu were bịa.

"Aha m bụ Ogechi mana o nwere oge o ruru, m gwa di m ya akpozila m Ogechi na ọ dịka aha m akpatara ihe na-eme m jị eme m."

Oriakụ Odunze kọwara na ime pụrụ ya ugboro atọ: ime ejima atọ; ime ejima abụọ nakwa ime otu.

"A dịla m ime ejima atọ pụrụ, abụọ pụọ, na otu kwa. Mụ na dị m na-ekpere ndị na-achọ nwa ekpere, ha amụta nwa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDi na nwunye mụrụ ejima atọ

"Akaebe na-eju n'ụlọụka anyị kwa mgbe. Anyị were na-ajụ Chukwu keɗụ oge Ọ ga-enye anyị nwa nke anƴị.

Mana egwu mechara tụgharịala di na nwunye a," Ogechi Udunze kwuru.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara