Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Nkwekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na Moroko

Akụkọ kachasị mere taa;

Onyeisi Inec ọ nọ na nsogbu?

Image copyright Inec Official Instagram
Nkenke aha onyonyo Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015

Ndị ndu mpaghara ọwụwa-anyanwụ, ndịda nakwa middle belt akpọọla oku sị wepụ Mahmoud Yakubu bụ onyeisi ndị otu na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC.

Ha kwuru na ụjọ na-atụ ha na otu INEC nwere ike ime ka a hapụ inwe ntuliaka ziri ezi n'afọ 2019.

Ihe Buhari gatara na Moroko

Image copyright @NGRPresident
Nkenke aha onyonyo Cheta na onyeisiala mba Moroko bụ Eze Mohammed nke isii bịara ịhụ Buhari na Naịjirịa n'afọ 2016

Isi apụtala na nzukọ Onyeisiala Muhammadu Buhari gara na mba Moroko.

Buhari na onyeisiala mba Morocco binyere aka n'akwụkwọ nkwenye na mba abụọ a ga-arụ okpo mmanụ gaasị ga-anọru afọ iri abụọ na ise, nke ga-enyere Naịjirịa aka ibuli azụmaahịa mmanụ gaasị na mpaghara West Afrịka na Yuropu.

Akụkọ mba ofesi;

Image copyright Sos Mediterranean

Ihe ruru ndị mbịara mbịara narị isii na iri abụọ na itoolu atọla n'elu osimiri Mediterranean.

Ha tọrọ maka na Matteo Salvini bụ minista na-ahụ maka ihe na-eme n'ime mba Italy jụrụ inye ikike ga-eme ka ụgbọ mmiri bu ha bata n'ime mba Italy.

N'egwuruegwu,

Ndị otu Super Falcons nke Naịjirịa ga-ezute ndị otu queen scorpions nke Gambia na Lagos taa.

Nzukọ ha bụ maka ịmata onye ga-emeri ma tozuo isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Cheta na Falcons ebuliela iko a ugboro iri kamgbe e ji malite emume a.

Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRussia 2018: Ọgụ 'rimotu' ebidola n'ezinaụlọ ndị a