MKO Abiola: Ihe 11 ị na-amaghị maka ya

MKO Abiola Image copyright iStock
Nkenke aha onyonyo Abiola nwụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998 bụ ụbọchị ekwesịrị ịtọhapụ ya.

Iji cheta ntuliaka emere n'ụbọchị iri na abụọ nke Juun afọ 1993 nakwa MKO Abiola dịka onye meriri, lee ihe ndị mmadụ kwesịrị ịma banyere Abiola.

N'afọ gara aga, onyeisiala Muhammadu Buhari kwanyere Abiola ugwu kachasị na Naịjirịa nke a na-enye ndị isiala bụ GCFR na bekee.

Image copyright @mko_abiola

Ọ kpọpụtara ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun, afọ 1993 dịka ụbọchị ọhụrụ maka ncheta ọchịchị onyekwuouche ya.

Ọtụtụ ndị nwereike ị na-ajụ ihe butere oke okwu a gbasara Abiola nakwa ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juun afọ 1993.

Lee ụfọdụ ihe ndị gbapụtara ihe na ndụ MKO Abiola.

Image copyright iStock
Nkenke aha onyonyo Abiola nwụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998 bụ ụbọchị ekwesịrị ịtọhapụ ya.

Ihe ịkwesiri ịma maka Abiola

  • Aha e ji mụọ ya bụ Moshood Kashimawo Olawale Abiola nke bụ MKO n'ịchafụ, n'abalị iri na anọ ọnwa Ọgọstụ, afọ 1937, n'Ogun Steeti.
  • Ọ bụ nwa nke iri na anọ nke nna ya ma bụrụkwa nwata mbụ pụtara ndụ ebe ndị ọzọ nwụrụ n'ezinaụlọ ahụ.
  • Abiola bụ onye achụmntaego nwere ụlọọrụ gụnyere nke ekwentị, nke mmanụ nakwa ọrụ ugbo.
  • Abiola zọrọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa n'afọ 1993 ma kpọrọ Babagana Kingibe dịka osote ya.
  • Ibrahim Babangida bụ ọchịagha na-achị Naịjirịa kagburu ntuliaka ahụ.
  • N'afọ 1994, Abiola kwupụtara onwe ya dịka onyeisiala Naịjirịa na mpaghara Epetedo nke Legọs bụ mmalite nsogbu ya na ọchịchị ndị agha.
  • Nke a butere nwụchi na ntaramaahụhụ nye ya n'afọ ise.
  • Abiola bụ editọ akwụkwọ akụkọ 'Trumpeter' ebe onyeisiala Olusegun Obasanjo bụ osote ya.
  • Abiola lụrụ ụmụnwaanyị anọ, mụọ ụmụ karịrị iri anọ.
  • Abiola nwụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998, bụ ụbọchị ekwesịrị ịtọhapụ ya.
  • Kamgbe ọnwụ ya, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ka a kpọpụta aha ya dịka onyeisiala, bụ nke onyeisiala Mohammadu Buhari mere ugbu a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: