Juun 12: Ị ma na ndị Igbo soro lụọ ọgụ a?

Olisa Agbakoba Image copyright Olisa Agbakoba/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ọkaiwu Olisa Agbakọba so na ndị lụrụ ọgụ Juun 12

Dika emere emume itunye MKO Abiola ugo pụrụ iche taa n'ihi mmeri o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993, ụfọdụ echefuola na ọtụtụ ndị Igbo soro mee ụghara iji mee ka ọchịchị ndịagha mejupụta ebumnobi ndị Naijiria tụnyeere ya votu.

Ilu Igbo na-ekwu, 'A lụchaa ọgụ, ụmụnwaanyị enwere akụkọ'. Ọtụtụ ndị ala anyị chefuru na ọtụtụ ụmụafọ Igbo dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ gọọmentị, ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye (activists) na ndị ntaakụkọ tinyere oge ha, akụ ha nakwa ije ụkwụ ha, ebe ụfọdụ gara mkpọrọ n'ihi okwu gbasara Juun 12.

Ndị Igbo so lụọ ọgụ Juun 12

Ọtụtụ ndị Igbo so lụọ ọgụ Juun 12 dị agụta agụta mana ndị aha ha na-ada ụda n'ọgụ ahụ gụnyere ndị a:

1. Humphrey Nwosu: Onye isioche ngalaba gọọmentị na ahụ maka ntulika nke a kpọrọ 'National Electoral Commission of Nigeria (NECON)' onye onyeisiala Naijiria oge ahụ bụ Ibrahim Babangida, tinyere n'ọrụ bido n'afọ 1989 rue 1993.

Ọ bụ Nwosu haziri ntuliaka Juun afọ 1993 nke e kwuru na ọ bụ ya bụ ntuliaka kacha kwuru ọtọ na nke niile emegoro na naijiria. Nwosu palitere 'Option A4' nakwa 'Open ballot'.

2. Ndubuisi Kanu: Onye chịbụrụ dịka Gọvanọ Imo steeti nakwa Legọs steeti n'oge ọchịchị Olusegun Obasanjo dịka onye agha.

Ka ọ lachara ezumike nka, Kanu so n'otu ndị lụrụ ọgụ maka Juun 12 nke a kpọrọ NADECO.

3. Olisa Agbakoba : Onye bụbụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọkaiwu Naijiria bụ 'Nigeria Bar Association (NBA)' na bekee sọ n'otu n'ime ndị Igbo kara aka soro na mbọ Juun 12. Agbakoba jiri otu o hibere bụ 'Civil Liberties Organisation (CLO)'

4. Arthur Nwankwo: Onyeisi Eastern mandate Union ma bụrụkwa osote onyeisioche NADECO.

A tụrụ ya mkpọrọ maka okwu gbasara okwu a.

5. Ralph Uwechue: Nwafọ Igbo larala mụọ bụ onye bụbu onyeisi otu Ohaneze Ndigbo.

Uchechue onye bụbụ onye nochite anya naijiria na mba Liberia so na Ndigbo gbara mbọ Juun 12

6. Ralph Obiora: Onye ndọrọndọrọ ọchịchị ama ama dọnyere ukwu na Juun 12.

7. Ebitu Ukiwe: Ọ nọrọ dịka osote onyeisiala Naijiria n'oge ọchịchị Ibrahim Babangida site n'afọ 1985 rue 1986. Ka Ukiwe onye bụ onye

Abiriba n'Abaịa steetiọ lara ezumike nka o soro n'otu ndị lụrụ ọgụ maka Juun 12.

Ihe ndị mmadụ kwuru

Otụtụ ndị mmadụ dịka Confidence na-ekwu na ọ bụrụ na-ewepụ Humphrey Nwosu, n'okwu juun 12 abụghị okwu a ga-na-ekwu taa n'ihi na ọ kpọrọ ndụ ya asị n'ime nke a.

Emeka Jerome toro Buhari maka ikwanyere MKO Abiola,Kingibe na Gani ugwu, ma kwuo na ọ dị mma ka ọkwanyere Humphrey Nwosu ugwu maka ị bụ onye na-akwụba aka ọtọ.

Na mkparịtaụka ha na BBC nwere, ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu na-egosi obi aṅụrị maka nturuugo gọọmentị nyere Moshood Abiola na Gani dịka 'GCFR' nakwa 'GCON".

Mana n'otu aka ahụ, ha gosiri mwute na e chefuru ndị Igbo soro lụọ ọgụ ahụ.

Onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye chịburu dịka onyeisi otu jikoro ndị ọkaiwu n'Onitsha bụ Obele Chuka Chuka kwuru: "Nke a bụ mbụ m nụrụ ụdịrị akụkọ ndị be anyị tụnyere yabụ Abiola akwụkwọ rienne karịa etu ndị Igbo si atụnyere ndị yoruba zọrọ ọchịchị akwụkwo.

"Ndị Igbo sokwa na ịkpọ ganigani bụkwa ihe ririnne. Mmadụ dịka Ndubuisi Kanu, Ralph Uwechue, Olisa Agbakoba, Ralph Obiora..."

N'okwu ya, otu ochie dike na ntaakụkọ bụ Abuchi Anueyiagụ kwupụtara ọṅụ ma ntunye ugo e mere MKO Abiola , matụọ arịrị na ndị Igbo soro lụọ ọgụ n'okwu Juun 12 dịka Humphrey Nwosu onye ha siri ntuliaka Juun 12 na Arthor Nwankwo onye 'tunyere ego' ya n'mbọ ahụ na e chezọrọ ha.