Gịnị mere nzu ji dị mkpa n'ala Igbo?

Nzu
Nkọwa foto,

Ọtụtụ ndị Igbo kwete na nwaanyị di ime racha nzu nwa ya dị n'afọ ga-apụta n'ụcha

Nzu bụ ihe pụtara n'onwe ya n'ime ala bụbu akpụkpụ eju dị n'ime ala ruo ọtụtụ puku afọ, mana i nwere ike iji aja, nzu sị na nkụ pụta, na kwa nnu agwọkọrọọnụ nwere mee nzu.

Gịnị ka eji nzu eme n'ala Igbo?

N'ala Igbo oge gboo, nzu maọbụ ọjị bụ ihe e ji anabata onye ọbịa.

Mgbe ahụ, ị bata na bee nwaafọ Igbo ọbụla, ha ga-enye gị nzu ka ite na njibi aka gị.

Nke a bụ maka igosi na obi gị nakwa ọbịbịa gị dị ọcha.

Nzu bụ ihe dị mkpa e ji egosipụta amamihe.

Ndị okenye na-aka nzu n'ala. Ihe a bụ igosi n' ebe ha nọ bụ ebe dị nsọ maka na ndị Igbo nwere nkwenye na onye ọbula were nsọ 'chi' n'ime ha.

Nkọwa foto,

Ndị bekee nwere nzu nke a akpọrọ 'White Chalks'

Emume a bụkwa maka ịkwanyere ala ugwu. Igbo nwere nkwenye na ọ bụ sọọsọ onye nwere obi ọcha ga-enwe ike ime nke a.

Nzu dịka ọgwụ ịgwọ ọrịa

Ruo ugbua, ọtụtụ ụmụnwaanyị nakwa nwoke na-ata nzu maka na ọ na-atọ a ụtọ mana ọ bụ ụmụnwaanyị di ime na-ata nzu nke ọma maka ịkwụsị agbọ na kwa oke asọ mmiri ọnụ.

Ụmụnwaanyị di ime na kwa na-ata nzụ maka ịgwọ ọrịa nke ụtụtụ akpọrọ 'Morning Sickness' na bekee.

Mana otu dị icheiche na-ahụ maka ahụ ike na-adọ aka na ntị na udi emume ga-ebute nnukwu ọrịa makana ọ nwere kemikal akpọrọ lead na arsenic.

Aha nzu n'ala ndị ọzọ

Ndị bekee kpọrọ nzu 'Chalk'. Ndị French kpọrọ ya 'La Craie' maọbụ Argile.

Ndị Calabar na-akpọ ya 'Ndom', ebe ndị Bini kpọrọ ya 'Eko.'