Akụkọ kachasị n'abalị: Buhari arịọla ezinaụlọ Abiola mgbaghara maka Juun
Buhari arịọla ezinaụlọ Abiola mgbaghara

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari rịọ ezinaụlọ MKO Abiola mgbaghara n'aha gọọmentị maka nkagbu a kagburu mmeri Abiola meriri na ntulịaka Juun 12 afọ 1993.
Buhari kwuru na oge eruola ezinaụlọ ka Abiola kpofuru ihe gara aga ma ga n'ihu.
Chimamanda Adichie aturuola ugo ọhụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Onye edemede akwụkwọ ama ama bụ Chimamanda Adichie bụ onye turu ugo dịka onye kachasị n'asọmpị a kpọrọ PEN Pinter Prize na bekee.
Ụlọikpe ukwu dị na Abuja amala onye bụbu Gọvanọ Plateau bụ Joshua Dariye ikpe imefụ ike karịrị otu ijeri naira maka idozi ihe mbize mebiri.
Ụmụakwụkwọ ụmụnwaaya ala Kenya emeela nghagharị iwe
Ebe foto si, Getty Images
Otu Ụlọakwụkwọ na mba Kenya a kpọrọ Maasai Girls High School mechiri n'ike maka ebubo eboro otu onyenkuzi nwoke na ọ wakporo otu nwaakwụkwọ nwaanyị n'ike.
Cheta na nke a mere ya ugboro abụọ udị ihe a mere na mba na nsonso a.
Trump na Kim emeeela ọgbakọ
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ala mba Nọt Koria bụ Kim Jon-un ekweela nkwa na ya ga-emebi ngwọ agha nukilia ya kpam kpam.
Jon-un kwuru nke a n'ọgbakọ ya na Donald Trump nke Amerika mere taa, ebe Trump kwuru na ya ga-akwụsị mba ọgwụ imegide Nọt Koria.
Julen Lopetegui ga-abụ onye nchịkọta ọhụrụ otu Real Madrid
Ebe foto si, Getty Images
Julen Lopetegui bụbu onye nchịkọta otu egwuregwu mba Spen
N'egwuregwu, onye na achịkota otu bọọlụ ala Spain bụ Julen Lopetegui ga-abụ onye nchịkọta ọhụrụ otu egwuregwu Real Madrid na ngwụcha iko mba ụwa na Róshía.
Lopetegui binyere aka n'akwụkwọ ínọchị Zinedine Zidane.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
"Nwa m dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1"