Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wole Soyinka kwuru na ya natara Naịjirịa mgbaghara Buhari

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:

E tigburu igwe ndị AKpugo Nkanụ n'Enugwu

Ụfọdụ ndị ntorobịa n'Ọgbọzinne dị n'Akpugo Nkanụ Enugwu steeti tigburu Igwe ha bụ Steven Nwatu maka esemokwu bidoro kemgbe afọ iri.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu kwuru na ndị uweojii amalitela nyocha ịmata ihe kpatara nsogbu dịbu n'etiti Igwe ndị Ọgbọzinne Akpugo bụ Steven

Naịjirịa

Buhari na ndị gọvanọ otu pati APC nwere ọgbakọ ụnyaahụ.

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari na dị gọvanọ nọ na pati APC nwere ọgbakọ ụnyaahụ nke osote onyeisiala bụ Yemi Osibanjo sokwa na ya.

Ọgbakọ a bịara ka onyeisiala nyesịrị onye e kwuru meriri ntuliaka Juunu 12 afọ 1993 bụ MKO Abiola nturu ugo kachasị na Naịjirịa.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Wole Soyinka na-anatara ụmụ Naịjirịa mgbaghara

Image copyright Getty Images

Onye na-ede akwụkwọ na Naịjirịa a ma ama bụ ọkammụta Wole Soyinka ekwuola na ya na-anabata mgbaghara onyeisiala Buhari rịrọrọ ezinaụlọ Abiola maka ụmụ Naịjirịa niile.

Akụkọ mba ofesi

Amerịka na Nọt Koriya enwetala nkwekọrịta

Image copyright AFP

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agwaala nke Nọt Koria bụ Kim Jong-un na o nwereike ịbịa hụụ ya n'ụlọ White House Amerịka ebe Kim gwakwara Trump na o nwere ike ịbịa Nọt Koria.

Ọgbakọ Trump na Kim mịtara mkpụrụ nkeọma ebe Trump dọghachitara ụfọdụ ndị agha Amerịka na Sawụtụ Koriya nwere.

N'egwuregwu,

Super Eagles anaghị agba bọọlụ n'ịdị n'otu

Image copyright Super Eagles/ Twitter

Onye nchịkọta kpọ Super Eagles gaa asọmpi Iko Mbaụwa n'afọ 1994 bụ Bonfrere Johanes kwuru na ndị Super Eagles ugbu a na-agba bọọlụ nkeonwe bụ nke nwere ike ime ka ha ghara ime nke ọma na Rọshịa.

Bonfrere kwuru na Super Eagles nke ugbu a dị iche na ndị nke ọ kpọrọ gaa asọmpi a na mba US n'afọ 1994.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe mere ndị ntọ jiri tọrọ nne m - Okonjo-Iweala

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a