Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Rọshịa na Sawudi Arebia ga-akwata ya taa

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Akpugo dịka ebe a gbara ọsọ.

Akpugo

Akpugo dị na Nkanụ n'Enugwu steeti ebe ndị ntorobịa gburu Igwe ha dizi ka ebe a gbara ọsọ agha.

Oge BBC Igbo gara ebe ahụ, anyị zutere ụlọ ndị mmadụ gbachichara agbachi mana ndị uweojii ka na-achọ ndị kpara ike ahụ.

Naịjirịa

Ụlọomeiwu n'Abịa steeti achọghị ka ewepu iwu ịkwụsị ịchịehi na mbara.

Ụlọomeiwu Abịa steeti

Ebe foto si, Hon Chikwendu/ Facebook

Onyeisiala ụlọ omeiwu Abia steti bụ Chikwendu Kalụ akatọla ndị na-akpọ ka e wepụ iwu megidere ịchụehị na mbara nke steeti ahụ hibere.

Chikwendu kwuru na iwu ahụ bụ naanị etu a ga-eweta udo n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Onyeisiala ebinyeghi aka na bọjeti ụnyaahụ.

Buhari

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/ Facebook

Ụlọọrụ onyeisiala ebugharịkwala ibinye aka na bọjeti afọ a dịka ha kwukwaziri na ọ ga-abụ n'izuụka na-abịa.

A na-elebu anya na onyeisiala ga-ebinyeaka na bọjetị ahụ ụnyaahụ mana o meghi ya.

Akụkọ mba ofesi

UN adọla Izrael aka na ntị.

Otu mbaụwa UN

Ebe foto si, United Nations/ Facebook

Izrael anatala ịdọ aka n'a ntị site n'aka ndị otu UN dịka ha katọrọ ndị Izrael maka na ha ji ike emegide ndị Palestinian na-abụghị ndị agha.

Otu ahụ katọkwara ndị si na Gaza atụ ogbunigwe na Izrael ma na ọ kpọghị Hamas aha.

N'egwuregwu,

Rọshịa 2018 bụ taa ka ọ na-ebido, onye ga-ebu iko a?

Iko Mbaụwa

Ebe foto si, Reuters

Otu egwu bọọlụ iri atọ na abụọ, asọmpi iri isii na anọ, ọgbọ egwuregwu iri na abụọ n'ime isi obodo iri na otu, mba Rọshịa ejikerechala maka asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2018.

Ọ ga-ebido taa maa kpọtụọ akpọtụ oge Rọshịa ga-eche mba Sawudi Arebia ihu.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

"Nwa m dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1"