Kedụ ihe mere ndi mmadu adịghị acho inye ọbara na Naịjirịa?

Ọbara

Ebe foto si, Getty Images

Kwaa afọ, otu ahụike mbaụwa bụ WHO na-eme mmemme icheta ndị na-eji onwe ha enye ọbara e ji azọ ndị mmadụ ndụ.

Ha wepụtara taa ime ya bụ mmemme n'ụwa niile gbaa gburugburu.

Ọ bụrụ na ihe mberede siri ike mee, gọọmenti na-adị akpọ oku ka ndị mmadụ gaa n'ụlọọgwụ nyee ọbara iji zọọ ndụ ndị nọ n'ahụhụ.

Otu onye na-enye ọbara BBC Igbo gwara okwu bụ Ezinne Aninwe kwuru na ya na-enye ọbara maka na o nwere mgbe nne ya na nna ya chọrọ ọbara n'ụlọọgwụ oge ahụ esighi ha ike.

N'okwu ya; "Nne na nna m nwere oge ha chọrọ ọbara oge ha dị ndụ, ya mere m ji chee na ọ ga-enye aka ime ka ọbara na-eru ndị ọrịa chọrọ ya aka ọsịsọ.

"Inye ọbara n'aka ndị NBTS ebe anaghị akwụ ụgwọ nakwa eme ọ dị ọnụala igote n'ọnụ ego puku naịra abụọ karịa puku naịra 10 gbagowe a na-ere ya ebe ndị ọzọ."

Ebe foto si, Ezinne Aninwe

Nkọwa foto,

Inye ọbara na-eme ka ọ na-eru ndị chọrọ ya aka ọsịsọ

Otu onye ọzọ anyị gwara okwu bụ Chinonso Ugwungene kwuru na ya anaghị enye ọbara maka na ya enweghi nnukwu nke inye mmadụ.

N'okwu ya: "E chere m na ndị na-enye ọbara bụ ndị nke ha karịrị akarị, echeghi m na m nwere nnukwu inye mmadụ."

N'akụkụ nke ya, Doris Ezeh kwuru na inye ọbara di mma, maka izoputa ndu ndi no na mkpa obara.

"M chọọ inye ọbara, ana m aga n'ulọọru ndị gọọmentị n'ihi na achọghị m ka ọbara m baa n'aka ndị ekperima. Ọzọkwa bụ ka ndị nọ n'ọrụ ahụike leleere m ọbara m nke oma, hụ na etoruru m inye ọbara, ya na odighi nje ọbụla dịkwa n'ọbara m.

Agaghị m enye obara ma ọbụrụ na m di ime, enye nwa ara maọbu arịa ọrịa."

Onye ọrụ ahụike BBC Igbo gbara ajụjụọnụ bụ Ọzọrọ Dọkịnta McGinger Ibeneme kwuru na inye ọbara ka bụkwa nnukwu nsogbu ebe ụmụ Naịjirịa nọ.

Ọ gụpụtara ụfọdụ ihe na-ajụ na ndị mmadụ anaghị enye ọbara.

Ihe na-eme ndị mmadụ anaghị enye ọbara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ụfọdụ ndị na-enye ọbara na-ere ya ere ebe ụfọdụ na-enye ya n'efu

  • Ụjọ: Dọkịnta Ibeneme kwuru na ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ekwe enye ọbara bụ maka ụjọ na ha nye ọbara, ọbara dị ha n'ahụ agaghị ezu. Mana ọ kọwara na tupu onye ọrụ ahụike ọbụla amịrị mmadụ ọbara, o ga-elele ahụ onye ahụ hụ na o nwere ọbara ga-ezu gụnyere nke ọ ga-enye
  • Ụjọ Ọrịa: O kwukwara na ụdị ụjọ ọzọ ji ndị mmadụ bụ na ha nyesịa ọbara, e nyochasịa ọbara ahụ, a hụ nje maọbụ ọrịọ́ zoburu ezo nke ndị ahụ na-achọghị ịma maka ya dịka nje HIV maọbụ nje Hapataitis
  • Okpukpe: O kwuru na ụfọdụ bụ okpukpe ha mere na ha anaghị enye ọbara maka na okpukpe ha megidere inye maọbụ ịnara ọbara
  • Ụmụnwaanyị anaghị enye maka nsọ ha: Ụfọdụ ụmụnwaanyị kwuru na ha na-agbapụ ọbara kwa ọnwa site na nsọ nke mere na ha ekwesighizi inye ọbara ọzọ. Mana ndị ọrụ nchekwa kwuru na nwaanyị nwereike inye ọbara ugbo atọ n'afọ ebe nwoke nwereike inye ugbo anọ n'afọ.

Dọkịnta Ibeneme kpọkukwara ndị mmadụ atụmadụ ndị nwere ọbara dị ụkọ dịka ọbara (B negative, O negative na AB negative).

Ọzọr Ibeneme kwukwara mkpa ọ dị na gọọmentị na-eme mgbasaozi iji kwalite mmụọ ndị mmaọ̄ụ n'uru ọ dị inye ọbara nakwa ikele ndị na-enye enye.

Aha onyonyo,

McGinger Ibeneme

Uru inye ọbara bara

Ọ dịghị mma ọbara ịkarị mmadụ n'ahụ maka na ọ na-ebukwa nsogbu nke ya dịka ike ọgwụgwụ. Inye ọbara nwekwara uru ndị ọbara, dịka ndị Paras Global Hospital si kwuo, nke abụ uru dị n'inye ọbara:

  • Ịzọ ndụ: Ọtụtụ ndị mmadụ chọrọ ọbara n'ụwa niile maka ụdị ihe ha na-agabiga. Nchọpụta kwuru na kwa ntabianya ọbụla, otu onye na-achọ ọbara, nke a mere inye ọbara ji dị mkpa maka na ị maghị onye i nwereike ịzọ ndụ
  • Inye ọbara na-asacha ahụ: Mmadụ nye ọbara, ihe na-eme ọbara n'ime ahụ ya ga-agbada nke ga-eme na ọ ga-ebido ịrụ ọrụ ọzọ iji weghachitekwa ọbara pụrụ apụ. Usoro a dị mkpa ma bakwa uru n'ahụ mmadụ maka na ọ na-eme ka ahụ mmadụ sacha ma dịkwa jụụ ma mekwa ka ụfọdụ ihe mgbu na-eme mmadụ kwụsị. Ya bụ. inye ọbara na-eme ahụ gị esikwuo ike ma mee ka mmadụ nwee ogologo ndụ
  • Ị ga-eme nyocha tọrọ atọ: Tupu inye ọbara, ụlọọgwụ ga-enyocha gị na ihe ndị i nwere n'ọbara gị nke ga-eme ka inweta nyocha tọrọ atọ n'efu. Mmadụ ekwesighi ituegwu maka ịnye ọbara maka na ọ dị mkpa ime nyocha n'ahụ maka ahụike gị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: