Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị ndu ala Igbo ekwesighi ịrapụta ndị Ipob
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Mbazulike Amaechi ekwuola na ndị ndu agaghị ịgbaghapụ ndị Ipob
Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbụ mịnịsịta okwu gbasara njem ụgbọelu n'oge gara aga bụ Mbazulike Amaechi akatọọla ndị ndu n'ala Igbo na ha rapụtara ndị otu Ipob na ndị ọzọ na-achọ Biafra.
Ameachi kwuru na Ọ bụrụgodi na ndị ndu n'ala igbo ekwenyeghi na Biafra, ha agaghị ịrapụta ndị na-achọ ya maka na ihe ha na-eme adịghị njọ.
Naịjirịa
EFCC na-enyocha Babachir Lawal
Ebe foto si, Channelstv
E boro Babachir ebubo na o jiri nde narị naira abụọ ịsụọ ahịa
Onye bụbu odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa bụ Babachir Lawal ekwuola na ya na-anabata nyocha ndị EFCC na-eme maka ebubo mpụ e boro ya.
Cheta na nchọpụta na-ebo Lawal ebubo na o ji ego karịrị nde naịra narị abụọ wee sụọ ahịhịa ebe o nyekwara ụlọọrụ aha ya dị dịka onyeisi ọrụ ahụ.
Akụkọ mba ofesi
Onye Yuganda mepụtara ngwọọrụ na-enyocha ọrịa mba ma ejighi ọbara
Ebe foto si, Africa Proof
Otu onye na-emempụta ihe na mba Uganda bụ Brian Gitta atụrụla ugo dị elu maka ihe ọ mepụtara e ji enyopụta nje ọrịa ịba na-ejighi ọbara ọbụla.
Gita turu ugo Royal Academy of Engineering n'Afịrịka maka ngwọọrụ ahụ na-egosi ọrịa ịba site na-ịcha ọkụ mmemme.
N'egwuregwu,
Asọmpi Iko Mbawụa ka na-aga n'ihu
Ebe foto si, Getty Images
Ebe foto si, Getty Images
Asọmpi Iko Mbaụwa ka na-aga n'ihu ebe Ijipit ga-ezute Urogwe ma Moroko ga-ezute Iran taa.
Cheta na Rọshịa jiri ọkpụ goolu ise asaghị cha cha merie mba Sawusi Arebia we bido ya bụ asọmpi ụnyaahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
"Nwa m dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1"