Ọgụ anyị na ndịagha n'aba bụ 'obele nsogbu' anyị na-ahazi - onyeisi uweojii Imo

Ndị uwe ojii na ndị agha Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oteela ndị uweojii na ndị agha na-enwe mkpakpa di icheiche na Naịjirịa

Onyeisis ndị uweojii n'Abia steeti bụ Mike Anthony gwara BBC Igbo n'ọgbaghara daara n'etiti ndị ọlu ya na ụfọdụ ndịagha Naịjirịa na steeti ahụ ụnyaahụ bụ 'obele esemoku'.

Cheta an ọgbaghara banyere Osisiọma nke dị n'Aba n'Abia steeti ụnyaahụ mgbe ndịagha Naịjirịa na ndị ọgbọ ha bụ ndị uweojii kwara mgbọ.

Anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na nsogbu bidoro mgbe ndị agha kparala onye uweojii aka ma chọ ịkpụba ya n'ụlọọrụ ha.

Ndị ntaakụkọ na-ekwu na mgbọ egbe gbụrụ mmadụ atọ n'ọgbaghara a ka ndị ọzọ ekwughị ole ha dị merụrụ ahụ.

Dapchi: Ndị agha na ndị uweojii enwela nghọtaghi

Ndịagha so n'ihe mere bụ ndị a na-eche na ha si ụlọakwụkwọ Ngwa High bụ ebe ha nwere ọgbọ akpọrọ "Forward Operation Base" ebe ndị uweojii aka ha dị na ya si "Mobile Police Force (pmf 55) Unit" nke dị n'Osisioma.

Ọbụghị mbụ ndịagha na ndi uweojii na-akwata ya.

Cheta n'ọnwa gara aga, ndị uweojii na ndịagha lụru ọgụ na Pọtacụt.

Maazi Anthony etinyeghi ọnụ ajụjụ BBC Igbo jụrụ ya banyere ọnwụ na mmerụ ahụ mana okwuru na ndị isi na ngalaba nchekwa ahu na-entinye ọnụ na ya bu oku.

BBC Igbo gbara mbọ inweta ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Texas Chukwu mana ọ zaghị ekwentị ya maọbụ saa ozi anyị degara ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara