Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị agha mmiri jidere ahịa iwu osikapa na-abata Naịjirịa

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Anwụchiela mmadụ maka ọgbugbu eze ndị Ọgbọzinne

Akpugo

Ebe foto si, Chimezie Ucheagbo

Ndị uweojii n'Enugwu anwụchiela onye e kwuru gburu eze ndị Ọgbọzinne dị na Nkanu na steeti ahụ.

Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed kwuru na a nwụchiri nwoke ahụ bụ Chibuike Odoh onye Mgbuji n'Ehamufu site na nchọpụta ndị uweojii n'otu nchekwa ndị ọzọ.

Naịjirịa

Mmadụ ole chọrọ oche onyeisiala?

PDP

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

PDP chịrị Naịjirịa afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị

Ntuliaka 2019 na ha ebiri ọkụ nwayọ nwayọ dịka otu onye ọzọ kwupụtakwara ebumnobi nke ya ịzọ ọkwa onyeisiala.

Onye a bụ onye chịburu Kaduna steeti bụ Ahmed Makarfi.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Osikapa bụkwa ahịa iwu

Osikapa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Osikapa bụ nri a na-erikari n'ezinaụlọ niile na Naịjirịa

Ndị agha mmiri Naịjirịa kwuru na ha jidere ụgbọ mmiri na-ebubata ihe ruru akpa osikapa ruru puku abụọ site na mba Kamerun.

Cheta na gọọmenti machiri mbụbata osikapa na Naịjirịa iji nye aka kwalite ọrụ ugbo ịkọ osikapa na Naịjirịa.enug

Akụkọ mba ofesi

Ụmụnwaanyị anabataghị ụfọdụ atụmatụ Trump gụnyere nwunye ya.

Nwantakịrị na-ebe akwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Foto ụmụaka anapụrụ nne ha dịka ha na-achọ ịgafe oke ala Mexico na Amerịka

Nwunye onye chịburu mba Amerịka bụ Laura Bush ekwuola okwu megide ọchịchị Trump maka atụmatụ ya gbasara ndị mbịambịa.

Nwaanyị Bush kwuru na atụmatụ ahụ na-etisa ụmụaka na nne dịka nwunye Trump kwukwara ka di ya jiri obi ya na-achị.

N'egwuregwu,

Asọmpi Iko Mbaụwa na-ebiri ọkụ.

Gareth Southgate

Ebe foto si, Getty Images

Dịka asọmpi Iko Mbaụwa ka na-aga n'ihu, mba England ga-ezute Tunisia na mgbede taa n'otu nke G.

Brazil na Swizaland ji otu ọkpu goolu gbaa onwe ha onye laba onye laba ụnyaahụ.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Gwa anyị ihe puru iche iji echeta nna gị?