Ụgbọ oloko egbuola mmadụ atọ na London

Ọdọ Loughborough Image copyright PA
Nkenke aha onyonyo A na-akọ na ụgbọ oloko a kụru ndị a n'abalị

Mmadụ atọ nwụrụ tata ka ụgbọ oloko kwọrịrị ha n'ebe adịghị anya na ọdọ oloko nke London.

A na-eche na ndị a nwụrụ ga-adị afọ iri abụọ na mmanye. Ahụkwara okpokoro ihe eji agba "paint" na ngụ ozu ndị a nwụru.

Akpọrọ ndị uweojii na "Loughborough Junction", na gbụrụgbụrụ Brixton ka ọ na-akụ elekere 07:30 nke ụtụtụ tata.

Ndị ọrụ gbata gbata kwukwara na ha anwụọla mgbe ha ruru ebe ahụ.

Ndị uweojii na-enyocha ihe etu ndị nwụrụ siri ruo ebe ahu ha nọ nwụọ, ma na-ekwukwa na ha aghọtaghị ihe gbụru ha.

Nkenke aha onyonyo Loughborough ndị na ụzọ esi a ga ọdọ ụgbọ oloko Herne Hill, Elephant na Castle

Supt Matt Allingham, bụ onye uweojii njem nke akpọrọ "British Transport Police" (BTP), kwuru na ahụ ndị a "dị ka ahụ ndị ọgbọ oloko kụrụ".

O kwuru na ọ bụ onye na-anya ụgbọ oloko ọzọ hụrụ ozu ụmụ nwoke ahụ were kpọ ndị uweojii. O kwukwara na "otela ndị ahụ nwụru tupu ahụ ha".

"Anyị ka na-achọ ịchọpụta ụgbọ oloko gbụrụ ndị a nwụrụ," Supt Allingham kwuru.

Ndị uweojii n=ka nọ ebe ahu ihe a mere na-acho ịchọpụta aha ndị nwụru ma gwa ndị nwe ha.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a