Akụkọ kachasị na-abalị: Ụlọikpe atụọla Ralph Uwazuruike mkpọrọ

Ralph Uwazuruike ga-aga mkpọrọ

Ralph Uwazuruike

Ebe foto si, Getty Images

Otu ụlọikpe na Owere tụrụ Ralph Uwazuruike bụbụ onyeisi otu na-achọ ị nweta onwe ha akpọrọ Massob mkpọrọ otu ọnwa makana ọ jụrụ ị bịa zaa ọnụ ya n'ụlọ.

Mana okaiwu Uwazuruike kwuru na mkpebi a gbagwojuru ha anya makana ha ka na-arịọ ụlọikpe nọ n'Abuja arịrịọ banyere ikpe a.

Otu ahịa na Benue agbaala ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Anya hụrụ ihe mere kwuru na ụlọ ahịa ruru otu narị lere n'ọkụ a.

Ọnụ na-ekwuchiri gọọmentị Bauchi steeti kwuru na ọ hịara ahụ ị mmenyụ ọkụ a makana ụzọ ị ga yabụ ahịa adịghị mma ncha ncha.

Ụgbọ oloko gburu mmadụ atọ na London

Ebe foto si, PA

Ndị uweojii kwuru na ugbua, ha agaghị enwe ike ikwu ka ihe a siri mee. Ha kwukwara na ha ka na-eleba anya na yabụ ihe.

Ọkara nke iko mba ụwa

N'Egwuregwu, Sweden meriri South Korea otu ọkpụ na asataghị ihe n'asọmpị ha taa n'iko mba ụwa.

Belgium jiri goolu atọ merụọ Panama ahụ n'asọmpị ha.

Tunisia na England ga-asụ mpi nke ha n'elekere asaa nke abalị a.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Fidelis Ilechukwu bụ onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ MFM sị na obi ume ala dịkarị mkpa n'idu ndị mmadụ.