Egwu eji gọọmenti etiti Naịjirịa maka mwakpo ndị ISIS?

Ọdọ ụgbọelu dị na Legọs

Ka ndị BBC gara n'ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed International Airport dị na Legọs, ha ahụghị ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa karịrị etu ha na-aha mbụ.

BBC gara n'ọdọ ụgbọelu ịmata na ọ bụ eziokwu na egwu dị n'ahụ gọọmentị etiti site n'akụkọ kwuru na otu a ma ama na-eyi mbaụwa egwu a na-akpọ 'Islamic State of Iraq and Syria' (ISIS) na Bekee na-ahụta Naịjirịa ka ebe ha nwereike ịzụ ndị omekome, ha na ndị Boko Haram.

Akụkọ na-ekwu na ndị agha ndị ISIS na-esi mba Syria ezubata ndị oyiegwu na Naịjirịa maka ọzụzụ na ha inwe ike wakpoo mba Briten.

Akụkọ a si n'akwụkwọ akụkọ ozi Sun nke mba Briten.

O kwuru na ebe ha na-akpọbata ụfọdụ ndị ọgụ ha na Naịjirịa, ụfọdụ ndị Boko Haram na-agakwa na Syria maka otu ọzụzụ ahụ.

Nke a mere gọọmenti etiti jiri nye iwu ka e kee nkwụcha n'ihe gbasara nchekwa n'ọdọụgbọelu Naịjirịa maka na ndị ISIS ahụ eyiela egwu na ha ga-agbatu otu ụgbọelu bu ndị njem wee kwafuo ọbara, n'elu.

Ya bụ iyiegwu dị na mgbasaozi dị n'otu igwe mgbasaozi nke ndị ISIS b Al-Abd aal-Faquir Media.

Nkenke aha onyonyo Otu onye na-arụ na 'airforce' na-achọghị ka a mara onye ọ bụ gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa karịrị mbụ nọkwa mana ha anọghị ebe anya ga-ahụ ha

Ndị akwụkwọ mgabasaozi Sun nke Naịjirịa, kwuru na dịka gọọmenti etiti nwetara iyiegwu ahụ, ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjirịa dere akwụkwọ ụbọchị Mee 25 2018, gara na ngalaba ụlọọrụ ụgbọelu bụ Nigeria Civil Aviation Authority (NCAA), ndị Federal Airports Authority (FAAN), na ndị onyeisi ndị ọrụ nchekwa oke bụ Nigeria Customs Service (NCS), na ndị ọrụ nchekwa niile nọ n'ọdọ ụgbọelu.

Akwụkwọ ahụ kwuru ka ha lebanye anya nke ọma n'ụzọ ha ji enyocha ndị na-apụ ma na-abata Naịjirịa, na akpa ha niile ma dịkwa uchu ịkwụsị ihe ọbụla nwere ike imetụta nchekwa oge ọrụ ha.

Akụkọ ndị ga-amasi gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara