Ihazigharị Naịjira ga-ebi nsogbu ya - Ohaneze

Nnia Nwodo
Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017

Nnia Nwodo kwukwara ka ndị Igbo bịakọta ọnụ ma dịrị n'udo dịka o kpọrọ oku ọhụrụ ka e lebara anya n'okwu gbasara ịhazigharị usoro ọchịchị Naịjirịa.

Ọbụghị naanị Nwodo kwuru okwu, ndị so ya bụkwa ndị Igbo ndị ọzọ a ma ama dịka onye bụbu onyeisi ndị agha na Legos bụ Kọmọdọ Ebitu Ukiwe, Rear Admira Ndubuisi Kanu na ndị ọzọ.

Ha kwuru okwu a oge a nabatara ndị isi ọhụrụ ohaneze Ndigbo na Legos steeti.

Nwodo bere nwịị maka mmekpa ahụ a na-enye ndị igbo na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa maka etu usoro e ji achị Naịjirịa si dobe ya.

N'okwu ya, "ihe ga-egbo mkpa a maka kwụsị nsogbu Naịjirịa bụ ka e dozigharịa usoro ọchịchị ma ya bụ ebe ndị Igbo kwụ."

Cheta na ụlọ omeiwu Naịirịa akwadoghi ya bụ atụmatụ nchịgharị oge e butere ya ebe ahụ mgbe a chọrọ idegharị akwụkwọ iwu Naịjirịa n'afọ gara aga.