Akụkọ kachasị na-ụtụtụ a: ụmụ Naịjirịa juru nga n'Itali
Ụmụ Naịjirịa 1500 nọ na nga Itali
Ebe foto si, Getty Images
ndị Naịjirịa 11,264 bi na Ịtali
Onye nnọchite anya mba Itali na Naịjirịa bụ Stefanou Pontesilli, ekwuola n'ihe ruru mmadụ 1500 bụ ndị Naịjirịa nọ na mkpọrọ na mba ha.
Stefanou Pontesilli gwara ndị nta akụkọ nke a ụnyaahụ n'Abuja.
Ohaneze ndị Igbo ekwuola na nhazighị ọchịchị Naịjirịa bụ ma ihe adị mma
Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017
Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnịa Nwodo ekwusiele ike ọzọ na nhazigharị Naịjirịa bụ naanị ụzọ a ga-esị kwọọ ya bụ onye ukwu wara ka ije wee kwe ojịje.
Nwodo kwuru nke a na Legos mgbe ha bịara ihibe ndị isi Ohaneze ndị Igbo n'ebe ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ga-eke nkwụcha
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa nwetere ikike ka ha kee nkwucha maka ndị omekome
Gọọmenti Naịjirịa akpọkuola ndị ọrụ nchekwa ka ha kee nkwucha pụrụiche n'ọdọụgbọelu na ụzọ ndị ọzọ e sị abata obodo a.
Oku a dị n'akwụkwọ ha degara ndị isi otu na-ahụ maka nchekwa njem ụgbọelu na Naịjirịa
Ọkara nke iko mba ụwa
Ebe foto si, EPA/CATI Cladera
Ịnglandị butere Iko Mbaụị̀a mbụ ha n'afọ 1966
N'egwuruegwu Iko Mbaụwa agbara ụnyaahụ Ịnglandị ji ọkpụ abụọ goolu abụọ asatara otu merie ndi Tunishia.
Kane ndị Ịnglandị tinyechere goolu abụọ ahụ.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
Gwa anyị ihe puru iche iji echeta nna gị?