Akụkọ kachasị n'abalị a: Foto Wizkid a na-ere ka akara dị ọkụ
Foto Wizkid na-aga ahịa

Ebe foto si, Getty Images
Ha na-eji otu puku narị naira iri asaa na itoolu na-ere foto oti egwu Wizkid
Foto a na-egosi Wizkid mgbe yiri uwe Dolce na Gabbana na mme mme ejiji na mba Italy nke akpọrọ Men's Fashion Week na Bekee.
Ndị agha Naịjirịa agọọla na ndị ohi mmiri gburu ha
Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa kwuru na akụkọ na-ekwu na ndị na-ezu ohi n'okporo mmiri gburu ndị agha atọ n'ọdọ mmanụ n'ime Bayelsa abụghị ezi okwu.
Abdullahi Ibrahim bụ onye na-ekwuchere ndị agha Naịjirịa kwuru na ya kpọrọ ndị ahụ n'elu ekwentị mana ha kwuru na onweghị onye wakporo ha
Ndị uweojii Anambra a nwuchiela ndị ohi akpa
Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii na Anambra steeti ekwuola na ha nwụchiela ndị ohi akpa ruru iri n'Anambra.
Ha kwuru na ndị a ji ọgba tum tum na egbe na-ezu ohi na Ogidi, Nnewi, Onitsha na Ihiala
Ide mmiri eriela ụlọ na ụgbọala na Ghana
Ebe foto si, myjoyonline
Na mba Afrika, mmiri ozizo ebuteela nnukwu ide mmiri na Accra n'ime Ghana na kwa mee ka ndị mmadụ tọọ n'ime ụlọ ha.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ụlọ lara n'iyi na mmiri nke a na kwa ọtụtụ ụgbọala mebiri.
Gọọmentị ka na-adọ aka na ntị na mmiri ya ka ga-ezo.
Ebe foto si, Getty Images
N'asọmpị Iko mba ụwa na-eme ugbua
Japan ji ọkpụ abụọ merie Columbia na asata ha ihe.
Senegal ọkpụ abụọ asata otu meri Poland
Russia na Ijipt ga-asọ mpi nke ha na-elekere asaa nke abalị a
Gee akụkọ anyị
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma taa