Ụmụnwaanyị Abịa achọghịzị mgbere nwa na akwụna cha cha

Ụmụnwaanyị Image copyright Getty Images

Ụmụnwaanyị Abịa steeti kpokotara onwe ha ọnụ wee rịọ ndị uweojii na steeti ahụ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ma kwụsị mgbere ụmụaka nakwa ụlọ ebe a na-amụ ụmụaka e ji atụ mgbere nke na-amụbanye na steeti ahụ.

Ihe ndị ọzọ ha rịọkwara bụ ka a kwụsị mmekpa ahụ nke a na-emekpa ndị mmadụ na steeti ahụ, nwakpo ụmụnwaanyị na akwụna

Ụmụnwaanyị ahụ kwuru na arụ ndị a a na-emeso ụmụnwaanyị nakwa ndị ọzọ na-emetọ ala Naịjirịa.

Ha rịọrọ ndị uwojii na steeti Abịa ka ha kwalite ebe ha na-eleta ụmụaka na ụmụnwaanyị nke a kpọrọ Juvenile and Women Center (JWC) na Bekee site n'imalite ụlọọrụ ga na-eme nyocha pụrụiche ma na-etinyekwa uchu na mkpesa gbasara ụdị arụ ndị ahụ ịhụ na ndị na-eme ya anaghị ala n'efu.

Onye ndu ụmụnwaanyị ahụ bụ nwunye aka na-achị Abịa steeti bụ Nkechi Ikpeazu na-arụ ọrụ iji kwụsị mmekpa ahụ megide ụmụnwaanyị na ndị na-anapụ ụmụnwaanyị oke na ugwu dịrị ha.

N'okwu nwaanyị Ikpeazu gwara Anthony Ogbizi bụ kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ, "Njem anyị bụ ịgba ndị uweojii ume ka ha na-eme nyocha banyere mmegide a na-emegide ụmụaka na ụmụnwaanyị ọsịsọ nakwa ịhụ na ndị na-eme ha agahị ala n'efu.''

"A na-akwanye ụmụanyị n'akwụna, na-awakpo ha ma jiri ha na-amụ ụmụ e ji atụ mgbere ebe a na-etikwa ụmụnwanyị ihe ma na-emetọ ha, ụfọdụ oge, a na-egbu ha na-ebe dị icheiche.''

"Anyị ma na ndị uweojii na-anwa ike ha ma na anyị na-agba ha ume ma na-akwado ha ka ha mekwuo iji jide ndị na-akpa arụ ndịa maka na ọ bụ ihe ịgba anya mmiri na ụfọdụ oge, ndị na-akpa arụ a na-ala n'efu maka na e nweghi ọkpụrụkpụ ihe ha ji aka iji jide ndị ahụ.

Iji kwado ndị uweojii ahụ, ọ nyere ha igwe kọmputa na akụrụngwa ya nakwa ụfọdụ akwụkwọ gbasara oke na ugwu ruru ụmụnwaanyị na ihe ndị ọzọ.

Na nzaghachi, kọmishọna Ogbizi kwere ụmụnwaanyị ahụ nkwa na ha ga-eleba anya na arịrịọ ha maka ọdịnaihu steeti ahụ.

Nwunye Ikpeazu bụ site n'atụmatụ ya nke ọ kpọrọ ''Vicar Hope Foundation'' na Bekee ka o ji enye aka iweghachite olileanya nye ụmụnwaanyị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: