Ọ ga-ara ahụ onye ntorobịa imeri ọkwa onyeisiala Naịjirịa - Yul Edochie

Ahmed, Fela and Yul

Ebe foto si, Ahmed Buhari/Fela Durotoye/Yul Edochie

Nkọwa foto,

Naijiria ga eme ntuliaka n'afọ 2019

Ọ bụ eziokwu na onye na-ekpokoba otu pati PDP bụ Austin Akobundu apụtala kwuo na onweghi mgbepati ahụ ji kwuo na akwụkwọ fọm iji zọọ ọkwa onyeisiala na pati apụtabeghi, mana akụkọ pụtara na ego ọnụ akwụkwọ fọm ahụ bụ nde naịra iri na abụọ.

Ya bụ ọnụ ego dịka o yipuru ndị mmadụ akwa n'ama ọkachasị ndị ntorobịa chọrọ ịzọ otu ọkwa ahụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla etu pati ga-esi tinye ego fọm ha n'ụdị ọnụ ahụ, ọ pụtara na o nwere ndị ha chọrọ ịchụpụ na-ebidobeghi ebido?

Ajụjụ a ka nwa ntorobịa Igbo chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019 ma bụrụ onye na-eme ihe onyonyo aha bụ Yul Edochie zara BBC Igbo.

Edochie kwuru na ọ ga-abụ ihe tara akpụ ka onye ntorobịa merie ntuliaka onyeisiala na Naịjirịa maka etu ihe si kwrụrụ.

O kwuru na ndị pati anaghị eme ihe n'usoro ga-adabara ndị ntorobịa.

N'okwu ya; "Ego ịgba akwụkwọ fọma ka bụ obere okwu, mgbe ịgbatasịrị akwụkwọ ahụ we gazie ịhụ ndị isi sekpụ ntị n'otu pati ahụ, ị hụ na ego karịrị akarị.

"Onweghi onye ntorobịa aka ya ga-eru n'ụdị ego ahụ."

Aha onyonyo,

Yul Edochie

Yul Edochie zọrọ ọkwa gọvanọ n'Anambara steeti n'afọ 2017 zọrọ ya n'okpuru pati APGA.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'iwu #NotTooYoungToRun n'oge na-adịghị anya inye ndị ntorobịa ohere ịbanye ọchịchị.

Iwu ahụ belatara afọ e tinyere e ji azọ ọkwa dị icheiche na Naịjịrịa mana ọ bụrụ na ndị patị tinye ụdị ego ahụ iji gbaa fọm na patị ha, ị mara na otu abụghụ n'ezi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: