IPOB: Anyị ebiela akwụkwọ ntuliaka referandum

IPOB Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

N'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Emma Powerful zitere BBC Igbo, otu Ipob kwuru na ha ejikerela maka agba mbụ n'ime agba atọ referandum ha na-akwado.

Ha sịrị: "A na-ebi akwụkwọ mbinyeaka nde 40 ma na-akwadokwa ikesaa ha ga obodo niile dị n'Biafra ka onye Igbo ọbụla dịrịla afọ iri naasatọ kwuo uche ha maka nnwereonwe Biafra."

Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụzọ ka ha ga-esi hụ na ndị ndị Igbo sonyere ọfụma n'ikwu uche n'okwu nnwereonwe Biafra ma nyere Ipob aka ihazi ihe ọbụla ha na-eme n'ọdịnihu.

Ha kwukwara na referadum ahụ ga-eweghachị nye ndị a na-eme emegbu emegbu nwee ohere ịchọ akaraaka ha nke ha boro na gọọmenti Naijiria nara ha.

Ipob kọwakwara n'oku ha na-akpọ maka Biafra abụghị oku agha.

Ha chetara Ohaneze na ndị Naijiria na referandum ha na-akpọ oku ya abụghị ihe ahụbeghị mbụ n'ihi na dịka ha sịrị kọwa, Naijiria akpọbuola oku a n'afọ 1961 ebe ha jụrụ ndị ọdịda-anyawụ Kamerun uche ha ma ha achoro isoro Kamerun , nke e mechara kewapụ ha n'udo na enweghị agha ọbụla.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: